Take a fresh look at your lifestyle.

DSS agbaala ama maka ndị na-akpa nkata mwakpo n’oge Salah

0 428

Ndị ọrụ nchekwa nzuzo Naịjirịa agbaala ama ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha kee nkwụcha n’oge emume ‘Eid-El-Kabir’ nke ga-adị n’izuụka ọzọ, maka na e nwere ndị na-akpa nkata ịwakpo ụlọ okpukperechi dị icheiche n’oge emume a.

Eid-El-Kabir bụ emume pụrụ iche maka ndị okpukperechi Islam, nke bụ oge ha ji egbu Ebini, na-akpọkwa oriri na nkwari.

Peter Afunanya, ọnụ na-ekwuru ndị DSS, wepụtara akwụkwọ ozi ebe ọ gbara ama a n’ụbọchị Tọzde.

Afunanya dọrọ ndị isi ahịa na ụlọ mgbakọ dị icheiche ka ha kee nkwụcha ma mụrụ anya iji gbochie atụmatụ ndị ekperima a chọrọ ibutere ụmụ Naịjirịa ihe anyammiri.

Ọ gara n’ihu kwuo na ndị DSS nakwa ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ na-arụkọ ọrụ ọnụ iji gbochie ọdachi ọbụla n’oge emume Salah.

Emume Eid-El-Kabir nke afọ a ga-abụ n’ụbọchị 27 na 28 nke ọnwa June. Ụbọchị ahụ na-abụkarị ezumike ọrụ na Naịjirịa.

N’ọnwa Julaị afọ 2015,mmadụ itoolu nwụrụ dịka ndị ọgụ Boko Haram tụrụ ogbunigwe n’ụlọ ekpere ndị Islam na Yobe Steeti.

Afunanya kwukwara na ndị ọrụ ncheka nke gụnyere ndị DSS wakporo ụfọdụ ogige ndị ekperima na Nasarawa na Kogi Steeti n’ime ụbọchị olemole gara aga, jide ụfọdụ ndị ekperima ahụ ma gbukwaa ndị ọzọ.

Nke a gụnyere Abubakar Muhammad onye e ji Abu Direba mara, onye na-atụ mgbere egbe na ngwaọgụ, bụ onye e jidere n’okporoụzọ si Abuja gawa Keffi, Nasarawa steeti.

Onye nke ọzọ bụ Kabir Bala, onye e ji Okwo mara, bụ onye si n’ụlọ mkpọrọ gbaa ọsọ ma hibe otu ndị ekperima na mpaghara Ejule nke dị n’okpuru ọchịchị Ofu na Kogi Steeti.

Okwo na ndị otu ya malitere ịkwa ndị ọrụ nchekwa mgbọ mana ha zaghachiri ma gbagbuo ya ebe ụfọdụ ndị otu ya ndị ọzọ gbara ọsọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *