Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Akwụsịla Gọvanọ CBN Ọrụ.

Rahila Lassa na Qasim Akinreti dere ya na bekee

0 601

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu GCFR akwụsịla Gọvanọ Central Bank of Nigeria (CBN) bụ Maazị Godwin Emefiele ọrụ ozugbo.

Ọfịs nke odeakwụkwọ gọọmentị nke Federation kwupụtara nkwụsị oru ya n’abalị Fraịde, June 9, 2023.

Onye isi mgbasa ozi, ụlọ ọrụ SGF, Willie Bassey, na nkwupụta gosipụtara na nkwụsị oru a na-esote nnyocha nke ụlọ ọrụ ya na-aga n’ihu na mgbanwe ndị e mere atụmatụ na mpaghara ego nke akụ na ụba.

Emefiele ka enyere iwu ka ọ nyefee osote Gọvanọ (Operations Directorate) ihe omume ụlọ ọrụ ya ozugbo, onye ga-arụ ọrụ dị ka Gọvanọ Central Bank ruo na ngwụcha nnyocha na mgbanwe ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *