Take a fresh look at your lifestyle.

Daalụ Maka Ịchọta m Ka Onye Kwesịrị Ekwesị, Gbajabiamila Gwara Onyeisiala Tinubu

Bilkisu Halilu Pai dere ya na bekee

0 316

Onyeisi ụlọ omebe iwu, Femi Gbajabiamila ekwela nkwa ịrụzu ọrụ ya nke ọma dị ka onye isi ndị ọrụ na President n’ịhụ na udo na ọganihu na Nigeria.

CoS ọhụrụ ahụ dere n’aka twitter ya iji kelee Onye isi ala Bola Ahmed Tinubu maka ịtụkwasị ya obi ịbụ onye isi ndị ọrụ ya.

“Ebe m nọrọla afọ iri abụọ gara aga na nzuko omeiwu Naijiria, na mgbe m nwetasịrị ntuliaka nke isii m n’ime ọgbakọ omebe iwu mba, mụ na Maazị Onyeisiala ga-arụkọ ọrụ n’ịrụ nnukwu ọrụ dị n’ihu ya maka udo na ọganihu nke gọọmenti etiti Naịjiria, o dere na tweet.

O kwere nkwa inye ike ya ka ọ na-ebido ọrụ na abalị iri na anọ ọnwa Juun, 2023.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *