A na-akpọ oku ka a kwụsị ibibi ụmụ nwanyị ugwu.
A kpọrọ oku a na Fraịde
, Ndị otu kpọrọ oku a mere ya n’oge ewepụtara akwụkwọ: ‘Ogorire: Our Blood, their Bond,’ nke onye ọrụ gọọmentị etiti bụ Maazị Kunle Awojemila dere n’Abuja.
Otu onye n’ime ndị o metụtara na nwunye Gọvanọ Olusegun Mimiko nke steeti Ondo bụ Oriakụ Olukemi Mimiko kọwara FGM dị ka ihe na-adịghị mma ma gbaa ume ka a kwụsị ya kpam kpam.
“Anyị ga-eti mkpu; ; anyị ga-ebufe ozi n’ime ụgbọ ala, ụlọ, ụlọ ọrụ na obodo anyị na anyị kwesịrị ịkwụsị FGM, ruo mgbe ọ nweghị otu nwanyị a na-akpaso ajọ omume a.
“E nweela ndị inyom bụ́ ndị ghọworo ndị aga n’ihi ọrịa ha malitere n’ụbọchị e bepụrụ ha ahụ́.
Leave a Reply