Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweojii Anambra anwụchie nwaaanyị a sị mekpara nwata dị asatọ ahụ

0 335

Akụkọ pụtara n’izu a nke gosiri otu nwata a sị dị afọ asatọ ebe o bu ọtụtụ ọnya n’akụkụ anya ya nakwa akụkụ ahụ ya ndị ọzọ.

Ndị uweojii Anambra steeti zipụtara ozi n’ụbọchị Sọnde a ma gbaa ama na ha anwụchiela nwaanyị a sị mere nwa odibo ya ihe a.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii steeti ahụ bụ Tochukwu Ikenga kwuru “Site n’ọrụ anyị na ministri na-ahụ maka ọdịnma ụmụnwaanyị rụrụ, anyị gbapụtara otu nwatakịrị nwaanyị dị afo asatọ na Nkpor n’akụkụ okporoụzọ King of Glory…”

O kwukwara “Anyị anwụchiela nne ya ukwu ma kpọgaa nwa ahụ bu ọtụtụ ọnya n’aha ụlọọgwụ maka ọgwụgwọ.”

“E nyefeela nne ya ukwu a dị afọ iri abuo na ise n’aka ngalaba nnyocha nke to State Criminal Investigation Department ugbua.”

Ihe onyonyo nakwa foto so akụkọ a saara ọkụ na soshal midia n’izu a nke mere ọtụtụ ji malite ịkpọ oku ka anwụchie nwaanyị a sị mere nwata ahụ ihe a.

N’ihe onyonyo ahụ, dịka otu onye nọ na-ajụ nwata ahụ ajụjụ, o kwuru na ọ bụ n’ihi na ọ tụrụ nwata n’ala mere e ji tie ya oke ihe ma mekpa ya ahụ.

Olu dara n’ihe onyonyo ahụ kọwara na ha hụrụ nwata ahụ n’ụzọ ebe nne ya ukwuu ziri ya ozi n’ụzụ ụtụtụ sị ya pụta gaa kpofuo ahịahịa agbanyeghi na ọ ka bu ọtụtụ ọnya nakwa apa n’ahụ ya.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.