Take a fresh look at your lifestyle.

Gọọmentị, CBN na NLC enweela nzukọ iji zeere abụbụọrụ

0 526

Gọọmentị etiti na ndị isi otu jikọrọ ndịọrụ Naịjirịa bụ Nigeria Labour Congress enweela ọgbakọ iji zeere abụbụ ọrụ ndị NLC sị na ha ga-agba ma ọ bụrụ na ụkọ ego ka na-aga n’ihu na Naịjirịa.

Ọ bụ Mịnịsta na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Chris Ngige kpọrọ ọgbakọ a n’ụbọchị Mọnde n’Abuja, nke onyeisi ụlọakụ etiti bụ Godwin Emefiele, na onyeisi ndị NLC bụ Joe Ajaero sonyere na ya.

Ndị NLC zigaburu akwụkwọ ozi nye Ngige ma na-ekwu na ụkọ ego dị na Naịjirịa ugbua emetụtala ndị ọrụ n’ụzọ dị ukwu, ma dọọ aka na ntị na ọ bụrụ na CBN emeghị ka ndị ụlọakụ nwee ego ha ga na-enye ndị mmadụ, na ha ga-amalite abụbụọrụ.

N’ọgbakọ ahụ, Emefiele, bụ onyeisi CBN kwuru na ha amalitelarị inye ndị ụlọakụ nnukwu ego ha ga na-akwụ ndị mmadụ iji belata ụkọ ego a.

O kwukwara na ha nyere ụlọakụ dị icheiche iwu ka ha rụọ ọrụ n’ụbọchị Satọde nakwa Sọnde iji na-akwụ ndị mmadụ ụgwọ.

N’okwu nke ya, Ajaero bụ onyeisi NLC kwuru na afọ juru ha maka nkọwa Emefiele nyere ma kwuo ha agaghị agazi n’iru ịgba abụbụ ọrụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *