Take a fresh look at your lifestyle.

‘Ndị ndọrọndọrọ ọchịchị na-ekesa okwu akpọmasị, kwụsịnụ ya ugbua’ – DSS

0 323

Ngabala ndị uweojii pụrụiche bụ The Department of State Services (DSS) adọọla ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ka ha gbaara nkesa okwu ikpọmasị ọsọ nakwa nkesa akụkọ ụgha nwereike ikpata ọgbaghara maọbụ nwereike itakọta isi ụmụafọ Naịjirịa na Onyeisiala Muhammadu Buhari maọbụkwanụ onye a họpụtara ịchị Naịjirịa bụ Bola Tinubu ọnụ.

N’ozi ọnụ na-ekwuru ha bụ Peter Afunanya zipụtara n’abalị Satọde o kwuru na ọgbaghara ndị na-achọ ịkpata tigbuo zọgbụ na-amụnye ọkụ ya ga-eregbukwa ha ma o suu.

Ozi a so mkpesa minista ọrụ bụ Festus Keyamo na-ekwukwara APC kwetere ha banyere okwu na Peter Obi nke LP na osote ya jụrụ ịnabata nhọpụta Bola Tinubu dịka onye ga-achị Naịjirịa.

Afunanya kwuru na ha ma maka atụmatụ ụfọdụ na-eme ịhụ na ọgbaghara dapụtara na Naịjirịa ugbua ma kwuo “ndị a tigbuo zigbụọ na-agụ gbaa mbọ wepụ aka na ya.”

“Cheta na ụlọọrụ anyị dụrụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ọdụ ka ha rube isi n’iwu dịịrị okwu ma bugara ụlọikpọ mkpesa ha ma ọ bụrụ na a nwere akụkụ ntuliaka ha na-enyo enyo.”

“Ọ bụ ihe doro anya na ụfọdụ na ndọrọ ndọrọ ọchịchị obi adịghị ma na-eso usoro ikpe a, nke a bụ ihe dị mma so usoro ọchịchị kwuo uche ya. Usoro bụ ihe anyị masịike ga-akwado udo nakwa nchekwa, ka ọha niile nabata nke a.”

“Mana ka o dokwaa ọha anya na ụlọọrụ DSS agaghị anabata ndị mmadụ maọbụ otu ọbụla ịme ha sọrọ ha bụ nke ga-akpata ọgbaghara. Ndị niile na-ekesa okwu akpọmasị bụ ihe nwereike ikpata ọgbaghara mọabụ metụta ọchịchị a họpụtaara Naịjirịa maọbụ akụkụ ọchịchị nọ ugbua kwụsị ya ngwa ngwa.”

“Ya mere, ndị ọrụ anyị jiaga n’ihu na-eme ihe ndị dị mkpa iji nyochaa ihe ndị mmadụ na-eme bụ nke na-achọghị ka mba anyị dị mma. Nke a bụ iji hụ na e nyere ụmụ amaala na ndị bi na gburugburu mba anyị ndụ dị mma nakwa ikike iga mkpa ha. Ka mmadụ niile nwere ire ya gụọ eze ha ọnụ.”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *