Take a fresh look at your lifestyle.

Inec akpọpụtala mmadụ iri meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ

0 359

Inec akpọpụtala aha mmadụ iri meriri ntuliaka ọkwa gọvanọ na steeti ha dị icheiche na ntuliaka e mere n’ụbọchị Satọde,abali iri na asato nke onwa Maachị, 2023, na mpaghara dị icheiche na Naịjirịa.

N’ime mmadụ iri ndị a, asatọ bụ ndị All Progressives Congress, ebe abụọ bụ ndị Peoples Democratic Party.

Ha gụnyere: Babajide Sanwo-Olu (APC) nke Legọọs, Dapo Abiodun (APC) nke Ogun Steeti, Seyi Makinde (PDP) nke Oyo Steei, AbdulRahman AbdulRazaq (APC) nke Kwara Steeti, Inuwa Yahaya (APC) nke Gombe Steeti, na Mai Mala Buni (APC) nke Yobe Steeti.

Ndị ọzọ bụ Umo Eno (PDP) nke Akwa Ibom Steeti, Umar Namadi (APC) nke Jigawa, Dikko Radda (APC) nke Katsina, na Ahmed Aliyu (APC) nke Sokoto Steeti.

E mere ntuliaka ọkwa gọvanọ na steeti 28 n’ụbọchị Satọde, nke pụtara na ọ fọdụrụ steeti iri na asato ebe Inec ka na-agụkọ mpụtara ntuliaka.

A na-ele anya na a ga-akpọpụta mpụtara ndị a taa bụ Mọnde.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *