Take a fresh look at your lifestyle.

Chimaroke Nnamani adaala ntuliaka Sinetọ

0 414

Aka chịburu Enugwu steeti bụ Chimaroke Nnamani adaala ntuliaka ọkwa Sinetọ na mpaghara Enugwu East.

Kevin Chukwu nke ‘Labour Party’ bụ onye tuuru ugo na ntuliaka ahụ dịka o nwetara vootu 69,136, ebe Nnamani, onye nọ na pati PDP nwetara vootu 48,701.

Cheta na ya bụ ntuliaka gaara adị n’abali iri abụọ na ise nke ọnwa Febrụwarị mana e bugharịrị ya n’ihi ọnwụ onye Labour Party na-azọbu ọkwa ahụ, bụ Oyibo Chukwu.

Ndị ojiegbe gburu Mazi Oyibo Chukwu dịka ọ fọdụrụ ụbọchị olemole tupu abali iri abuo na ise nke onwa Febrụwarị oge o si ebe ọ gara chụọ nta vootu na-alọta.

Kevin Chukwu, onye meriri ntuliaka a ugbua, bụ nwanne nwoke Oyibo Chukwu.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *