Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ndị omekome siri wakpoo otu ọgbọ ntuliaka na Kaduna

0 261

Ndị ọrụ Inec gbara ọsọ gbabaa otu ụlọ nọ nso ebe ahụ

Lee ka ndị ọrụ Inec siri zoo onwe ha n’ime ụlọ dị n’akụkụ ọgbọ ntuliaka nke Jaoji Model na Kaduna oge ndị omekome wakporo ndị pụtara ịtụ vootu ha.

Ndị omekome bụcha ngwa ọgụ pụtara ebe ahụ chusaa ndị mmadụ dịka ha tụchapụrụ vootu ha. Ndị ọrụ Inec nọ na-akwado ịgụkọ vootu ndị a tụrụ ebe ahụ mgbe ndị omekome ahụ wụchiri ebe ahụ.

Onye ntaakụkọ nọ ebe gwara ama na ọ ji anya ya hụ ndị ahụ dịka ọ sokwa gbaa ọsọ zoo onwe ya n’ime otu ụlọakwụkwọ nọ n’ogige ahụ.

Ọ kwuru na ha na-eche ka ndị omekome ahụ pụọ tupu amalite ngụkọ vootu ebe ahụ.

O kwukwara na ndị ọrụ nchekwa apụtaghị ebe ahụ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *