Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ ọrụ ndi na-emepụta akarongwa na steeti Nasarawa  nwetara ego n’ime steeti ahụ.

hauwa abubakar dere ya na bekee.

0 353

Ụlọ ọrụ ndi na-emepụta akarongwa na steeti Nasarawa  nwetara ego n’ime steeti ahụ.

Ụlọ ọrụ ndị dị na-emeputa akarọngwa na Nasarawa steeti dị n’ebe ugwu etiti Naịjirịa bụzi ndị na-enye aka na-enweta ego n’ime steeti ahụ, ka gọvanọ kwuru.

Gọvanọ Abdullahi Sule kwuru nke a n’oge mkparịta ụka mgbasa ozi iji nye ọrụ nlekọta nke oge mbụ ya na Lafia, isi obodo  steeti Nasarawa .

O kwuru na kamgbe e hiwere steeti Nasarawa n’afọ 1996, ụlọ ọrụ anaghị enye aka n’ego steeti ahụ, na ọ dabere n’oke  nke gọọmentị etiti.

Agbanyeghị, dịka Gọvanọ si kwuo, n’oge na-adịbeghị anya, steeti ahụ “ebulila IGR site na ijeri naira 7.1 ruo ihe karịrị ijeri naira 20 kwa afọ ma n’ihi nke a, anyị nwere ike ịkwụ ụgwọ ọnwa ndị ọrụ anyị ọnwa ole na ole n’enweghị oke n’aka ndị ọrụ gọọmentị.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *