Take a fresh look at your lifestyle.

Lee etu ị ga-esi agbanwe ego ochie

0 314

Ụlọakụ etiti wepụtakwara ụzọ etu ndị ka nwere ego ochie n’aka nwereike isi kwụnye ya n’ọbaego ha n’ụlọakụ, kama ọ ga-atọ ha n’aka bụrụzie akwụkwọ nkịtị.

Ọ bụ onyeisi Ụlọakụ Etiti nke ngalaba Bauchi Steeti bụ Haladu Idris Andaza kwuru nke a oge ya na ndị ntaakụkọ na-akparịta ụka na Bauchi.

Mana ọ bụ naanị n’ụlọọrụ Ụlọakụ etiti dị na steeti dị icheiche ka a ga-enweike ịkwụbanye ego ochie ndị a, ọ bụghị n’ụlọakụ nkịtị, dịka ndị CBN si kọwaa.

Ya bụ ọ bụrụ na ego ochie tọrọ n’aka, lee ihe ị ga-eme:

  • Gaa na websaịt CBN, debanye aha gị na ‘portal’ e kepụtara maka ịkwụnye ego ochie
  • I mee nke a, a ga-enye gị akara (code) ị ga-eji gaa kwụnye ego ahụ
  • Were akara ahụ gaa n’ụlọọrụ CBN dị na steeti gị
  • A ga-enye gị akwụkwọ ebe ị ga edebanye aha gị, akara ọbaego gị, aha ụlọakụ gị, nakwa akara njirimara ọbaego gị bụ BVN n’ịchafụ
  • Ị ga-egosikwa akwụkwọ njirimara onye ọbụla i nwere nke si n’aka gọọmentị, dịka NIN, Akwụkwọ ikike ịnya ụgbọala, akwụkwọ ikike ịtụ vootu, maọbụ akwụkwọ ikike ime njem mba ofesi (International Passport).
  • Ị ga-akwụnyezi ego ochie ahụ ma lawa, CBN ga-eziga ya n’ọbaego gị
  • Atụmatụ a ga-akwụsị n’abali iri asaa nke ọnwa Febrụwarị a

                                                                                                                                                                                 Mperi atụmatụ a ga-eri

Ọtụtụ ekwuola na usoro a CBN ga-esiri ọtụtụ mmadụ ike iji kwụbanye ego ha.

Ụlọọrụ ụlọakụ etiti na steeti dị icheiche na-adịkarị n’isi obodo steeti ahụ, iji maa atụ ụlọọrụ CBN n’Anambra Steeti dị n’Awka, nke Imo dị n’Owerri, nke Delta dị n’Asabba.

Ụfọdụ ndị bi na mpaghara ndị tere aka n’isi obodo steeti ga-enwe nhịahụ ịga kwụnye ego ha.

Ọmụmaatụ, onye bi na Warri maọbụ Sapele na Delta Steeti, ga-enwe nhịahụ ịga Asaba ga kwụnye ego ochie ya, ọ kachasị ụmụnwaanyị bi n’ime obodo.

Ọzọ bụ na ọ bụghị mmadụ niile ma etu e si eji igwe kọmputa, ekwentị ọgbara ọhụrụ, maọbụ ịntaneetị eme ihe.

Ọ gaghị adịrị ha mfe ịga na websaịt CBN, bịa gaa na ‘portal’ iji debanye aha ma nweta akara (code) ha ga-eji akwụnye ego ochie ha.

Onye ntaakụkọ gara lee anya na websaịt CBN, mana ọ hụghị ‘portal’ ọbụla e kepụtara maka ndị chọrọ ịkwụnye ego ochie ha.

Ọ bụrụ na e nwere ụdị ‘portal’ ahụ, onye na-amachaghị etu e si eji ịntaneetị eme ihe ga-enwe nnukwu nhịahụ ịchọta ya.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *