Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ndị uweojii si zọpụta ọtụtụ ndị NYSC ndị ojiegbe tọọrọ n’Ihiala

0 296

Ndị uweojii n’Anambra Steeti azọpụtala ndị otu ‘National youth Service Corps’ mmadụ iri na ise ndị ojiegbe tọọrọ n’ụbọchị Tuzde.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra bụ Toochukwu Ikenga kwuru na ọ bụ n’ebe elekere iri na otu nke ụtụtụ ụbọchị iri na anọ nke ọnwa Febrụwarị, ka ha zọpụtara ndị a ji otu afọ efe ala Naịjirịa n’aka ndị omekome jichiri ha.

“Ndị NYSC a mechara ọzụzụ ha izuụka atọ n’ogige ha dị n’Eziama-Obaire, ‘okpuruọchịchị Nkwerre, Imo Steeti, ma na-alaghachi Legọs, oge ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ha,” Ikenga kwuru.

“Ndị ojiegbe a buuru ha tinye isi n’okporoụzọ si Ihiala gawa Orlu ebe ha nọrọ jichie ha. Mana oge ndị ekperima a chọpụtara na ndị uweojii na-esochi ha azụ, ha gbahapụụrụ ndị NYSC ha tọọrọ ma gbalaga ọsọ.”

Ikenga kwuru na ha zọpụtara ndị ahụ na-efe ala nna, ma hazikwaara ha etu ha ga-esi malitekwa njem ha.

Mpaghara Ihiala n’Anambra steeti so n’ebe ọnọdụ nchekwa kacha dị njọ n’Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa.

Ọ bụ n’okporoụzọ a si Ihiala gawa Orlu ka ndị ojiegbe nọrọ wakpoo ma gbuo ndị agha Naịjirịa abụọ dịka ha na-eme njem maka agbamakwụkwọ ha n’ọnwa Eprel afọ 2022.

Ugboro ugboro ka ndị ọrụ nchekwa na ndị ekperima na-akwakọrịta mgbọ na mpaghara ahụ.

Ndị uweojii na-ekwu na ọ bụ ndị na-azọ nnwereonwe Biafra, a kpọrọ Ipob n’ịchafụ, na-eme mwakpo ndị a, mana Ipob na-agọ agọ na ọ bụghị ha.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *