Take a fresh look at your lifestyle.

Abụbụ Ọrụ: Minista Arịọla Ndị Njem, Ụlọ Ọrụ Ụgbọ Elu Mgbaghara

Cyril Okonkwo dere ya na Bekee

0 364

Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọ elu na Naijiria, Hadi Sirika arịọla ndị njem na ụlọ ọrụ ụgbọ elu arịrịọ, ndị njem ha na ọrụ ha mebiri n’ụbọchị Mọnde site n’abụbụ ọrụ nke ndị ọrụ Nigeria Aviation Handling Company, NAHCO, Plc, malitere.

Ndị ọrụ NAHCO bidoro abụbụ ọrụ iji chọọ ntinye ego n’ụgwọ ọnwa ma mee ka ndị njem tọ n’ọdụ ụgbọ elu.

Sirika, onye gwara ndị nta akụkọ State House okwu na Wenezde, kwuru na ụdị abụbụ ọrụ a agaghị eme n’ọdịnihu, na-arụtụ aka na ụlọ ọrụ njem ụgbọ elu bụ ọrụ dị oke mkpa.

Ọ gbakwụnyere na iwu Federal Airports Authority of Nigeria, (FAAN ACT), machibidoro abụbụ ọrụ na ọgbaghara na gburugburu ọdụ ụgbọ elu ebe gọọmentị ga-eji iwu gbochie ọgbaghara n’ọdịnihu.

“Ya mere, anyị ga-eme ya dịka iwu siri dị: anyị ga-ahụ na ọ nweghị ọrụ dị oke mkpa nke onye ọ bụla ga-akpaghasị n’agbanyeghị oke iwe” .

“E nwere ụzọ ndị ọzọ a na-esi eme okwu mgbe ha bilitere mana a naghị ekwe ka ha gbaa abụbụ ọrụ n’ihi na njem ụgbọ elu bụ ọrụ dị oke mkpa nke iwu kwadoro ugbu a” .
.
“A gam amara gị atụ, e nwere ụgbọ elu nke laghachiri n’ebe o si n’ihi na o nweghị ike ịda.

“Chee ma ọ bụrụ na e nwere onye ọrịa n’ụgbọelu ahụ, were ya na mmadụ na-aga okwu dị oke mkpa ma ọ bụ nwa akwụkwọ na-aga ule ma e mesịa mmadụ anwụọ n’ihi iwe onye ọzọ.”

N’ịdụ ndị ọrụ ọdụ ka ha were ohere ha nwetara na gọọmentị dozie esemokwu, Sirika siri ọnwụ na ọgbaghara n’ọdụ ụgbọ elu adịghị mma na agaghịkwa anabata ya ọzọ.

“Ntị anyị ghe oghe mgbe niile, gọọmentị na-ege ntị na mkpesa ọbụla yana enwere usoro maka ime ụdị mkpesa a.

“Ha kwesịrị ịkwụsị na nke a, ọ bụ ihe ọjọọ, anabataghị ya” .

Kansụl Kwadoro N11.08billion
Maka Njem Ụgbọ Elu

Sirika kwukwara na nzuko kwa izu nke Federal Executive Council nke Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo nọrọ n’isi ya kwadoro ihe dị ka ijeri N11.08 maka ọrụ na Mịnịstrị njem ụgbọ elu.

Dị ka o si kwuo, otu n’ime ọrụ ndị a kwadoro bụ maka ịrụzigharị ọdụ ụgbọ elu Hadejia dị na Jigawa Steeti.

O kwuru na ngụkọta ego akwadoro maka ọrụ a bụ N7,482,071,196.56.

O kwuru na e nyere Messrs CCECC ọlụ ngo ahụ maka ọnwa iri na asatọ.

“A na-arụ ụlọ njikwa (Control Tower) na ụlọ nkanụzụ n’Enugwu nke ọrụ ngo ya bụ Messrs Mascot Associates Limited na-ahụ maka ya n’ego dị N1,973,606,141.75.

“Ọrụ ngo nke atọ bụ maka ịzụ ụgbọ ala e ji arụ ọrụ nye Messrs Kaura Motors n’ọnụ ego dị N625,500,000,” Minista ahụ kwuru.

 

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *