Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Buhari Emepeela Okporo Ụgbọ Oloko Lagos

Timothy Choji dere ya na Bekee

0 183

Onyeisiala Muhammadu Buhari nọrọ Tuzdee mepee okporo ụgbọ oloko Lagos Blue Rail Line agba nke izizi ya, ma gbaa ụgbọ oloko site n’ọdụ ụgbọ Marina gaa nke National Theatre.

Onyeisiala nọ na njem ahụ, ya na Gọvanọ Lagos Steeti, Babajide Sanwo-Olu, osote ya bụ Dọkịnta Obafemi Hamzat, ndị otu Federal and State Executive Council, ndị otu Federal and State Legislative Assemblies, Onyeisi nke China Civil Engineering Construction (CCECC), Chen Sichang, ndị nta akụkọ na ndị ọzọ.

Akụkụ nke mbụ nke ọrụ a, nke Gọọmenti steeti mere, ogologo ya dị kilomita iri na atọ ma nwee ọdụ ụgbọ ise – Mile 2, Suru-Alaba, Orile Iganmu, National Theatre, na Marina.

Agba Nke Abụọ

Onyeisiala Buhari hụkwara mbinye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta maka ọrụ okporo oloko agba nke abụọ ya nke Onyeisi Lagos Metropolitan Area Transport Authority (LAMATA), Engr. Abimbola Akinajo na Onyeisi China Civil Engineering Construction Company (CCECC), Chen Sichang mere.

N’okwu nke ya, Gọvanọ Sanwo-Olu kelere Onyeisiala maka njem nleta steeti ahụ iji mepee ọtụtụ ihe nrụpụta dị ịrịba ama, ma na-ekwupụta na kemgbe afọ 1999 steeti ahụ enwetabeghị ụdị nkwado a site n’aka gọọmentị etiti.

 

Uru

N’ihe gbasara uru ihe nrụpụta a, Gọvanọ kwuru na ọ ga-ebelata oge njem, mee ka ndụ ụmụ amaala dịkwuo mma ma mee ka Lagos bụrụ otu n’ime obodo ukwu n’ime Africa nke ga-asọmpi nke ọma n’etiti obodo ukwu ndị ọzọ gburugburu ụwa.

Sanwo-Olu kwuru na ya ga-akpọ Onyeisiala ọzọ ka ọ bịa Lagos maka imepe Red Line, bụ nke ọ kọwara dị ka nnukwu ọrụ okporo ụgbọ oloko ma e jiri ya tụnyere Blue Rail Line.

”Ọdụ ụgbọ oloko Marina a mara mma ga-abụ nke kacha ibu na nke kacha arụ ọrụ n’Africa. Ọ nwere ike hazie ihe dị ka ndị njem narị anọ na iri ise kwa nkeji, nke pụtara na n’ime otu elekere ọdụ ụgbọ a nwere ike hazie ihe dị ka ndị njem puku iri abụọ na ise,”
O kwuru.

Ike Umenaba

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.