Take a fresh look at your lifestyle.

Katsina Steeti Ga-Anabata Onyeisiala Buhari

Timothy Choji dere ya na Bekee

0 365

Onyeisiala Muhammadu Buhari ga-amalite njem nleta ọrụ ụbọchị abụọ na Katsina Steeti dị na mgbago ugwu Naijiria na Tọzdee.

N’oge njem nleta ahụ, Onyeisiala Naijiria ahụ ga-emeghe ọtụtụ ihe nrụpụta nke ọchịchị Aminu Masari rụpụtara.

Ọrụ ndị a ma ama gụnyere Kofar Kaura Underpass, Kofar Kaura Water Works, Katsina State Internal Revenue House, Meteorological Institute, Darma Rice Mill, Batagarawa na Katsina State General Hospital na ndị ọzọ.

Ihe nrụpụta ndị a gbasara n’ime Senatorial Districts atọ e nwere na steeti ahụ.

Gọọmenti steeti ahụ ewepụtala Tọzdee ụbọchị iri abụọ na isii na Fraịdee 27th Jenụwarị ka ụbọchị ezumike ọha iji mee ka ụmụ amaala steeti ahụ nabata Onyeisiala Buhari bụ nwa afọ steeti Katsina a ma ama.

Onyeisiala rutere steeti ahụ n’abalị Wenezde site na Dakar nke Senegal, ebe o sonyeere na 2nd Darkar Agricultural Summit.

 

 

Ike Umenaba

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *