Ọṅụ juru ndị ekpere Adoration Ministry Enugu Nigeria n’obi taa bụ Wenezde, dịka onye ndu ha bụ Ụkọchukwu Ejike Mbaka lọghachiri Naịjirịa.
Igwe mmadụ juru n’ọdọ ụgbọelu Akanu Ibiam dị n’Enugwu iji nabata Mbaka, bụ onye nọbụ na mba Amerịka ebe ọ gara njem ekpere na St Andrew’s Abbey Monastery nke dị na Los Angeles.
Ndị ekpere Adoration ji ụtụtụ juputa n’ọdọụgbọelu Enugwu iji nabata ụkọchukwu Mbaka, mana ụgbọelu bu ya batara tụrụ ụkwụ n’Enugwu.
Akụkọ kwuru na ọ bụn’ụbọchị Tuzde ka Mbaka si Amerịka lọbata n’ọdọụgbọelu Legọs, ma sizie ebe ahụ bata Enugwu n’ụbọchị Wenezde.
Cheta na ọpụpụ Mbaka pụrụ gawa ‘Monastery’ bụ ntaramahụhụ Bishọp ụka Katọlik n’Enugwu bụ Callistus Onaga nyere ya n’ihi ụfọdụ okwu Mbaka kwuru nke Bishọp kwuru na ọ dabaghị n’usoro okwukwe ụka Katọlik.
Leave a Reply