Take a fresh look at your lifestyle.

Onye Ndọrọndọrọ APGA N’oge Gara Aga Akpọọla Oku Maka Ịdị N’otu, Udo Na Ndidi

Bitrus Kozah dere ya na Bekee

0 435

Agbaala ndị Naijiria ume ka ha na ibe ha na-ebikọ ọnụ na ịdị n’otu n’agbanyeghị agbụrụ ma ọ bụ obodo ha.

Ọ bụ onye ji ọkọlọtọ APGA were zọọ ọkwa onyeisiala n’oge gara aga, Major General John Gbor (Rtd) kwuru nke a n’oge ngosi akwụkwọ ọhụrụ n’Abuja isi obodo Naijiria.

General Gbor na ngosipụta akwụkwọ aha ya bụ “Nigeria: A nation yearning for Moral Regeneration and unity” kpọkuru ndị ntorobịa Naijiria ka ha bute Naijiria ụzọ ma gbanarị esemokwu agbụrụ ma ọ bụ okpukpe dị iche iche.

Major General John Gbor lara ezumike nka bụ onye zọrọ ọkwa onyeisiala Naijiria n’afọ 2019 n’ọkọlọtọ paati APGA.

 

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *