Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọ Ọrụ Nchụta Ego Na Steeti Kogi Enwetala Ijeri Naira Iri Na Asatọ N’afọ 2022

Ishaq Dan Imam dere ya na Bekee

0 366

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka nchụta ego n’ime Kogi steeti enwetala ego ruru ijeri naira iri na asatọ dịka ego nchụta n’ime ya bụ steeti nke a kpọrọ Internally Generated Revenue (IGR).

Steeti ahụ mere atụmatụ mmefu ego dị ijeri naira iri abụọ na atọ dịka ego a ga-enweta n’ime afọ a, mana ọ bụ naanị ijeri naira iri na asatọ ka ụlọ ọrụ na-ahụ maka nchụta ego na steeti ahụ nwetara n’ihi ụkọ nnweta ego n’afọ a.

Onye nnọchite anya onye isi oche ụlọ ọrụ na-ahụ maka ego na steeti ahụ bụ Maazị Sule Salihu Enehe kwupụtara nke a n’ụbọchị Fraịde ka ọ na-ewepụta ozi ngwụcha afọ 2022 gbasara iji igwe electronics anakọ ụtụ site n’aka ụlọ ọrụ na-ahụ maka nchụta ego na steeti ahụ.

Mazị Enehe, bụ onye nyere nkọwa gbasara usoro ịnakọta ụtụ, ihe ndị ọ rụpụtara na ihe ọhụrụ n’ịchịkọta ụtụ isi na steeti ahụ, nyere ọha na eze akwụkwọ ikike ọrụ iji kwalite ọrụ nlekọta ụtụ isi n’okpuru ọchịchị ya.

Onye isi oche ahụ kwuru na akwụkwọ ikike ọrụ ahụ na-enye ndị ọrụ ụlọ ọrụ na ọha na eze ụkpụrụ ọrụ iji nweta nkwalite n’ọkwa ego iji nweta nrube isi n’ụtụ isi, na-agbakwunye na, “anyị na-anabata ihe ndị mmadụ chọrọ.”

Onye isi nchịkwa ụtụ isi steeti ahụ kwupụtara na ndị ọrụ na-arụrụ aka bụ ndị ụlọ ọrụ ahụ chọpụtala ma gbaa ha akwụkwọ n’ụlọikpe maka akwụkwọ ikike Tax Clearance Certificates (TCC) adịgboroja ma gbakwụnye na TCC adịgboroja bụzi akikọ ochie na steeti ahụ.

Maazị Enehe, kwuru na ụlọ ọrụ ahụ ewepụtala e-platform maka ịkwụ ụtụ isi niile nke bụ maka ọdịmma ndị ahịa na maka usoro nlekọta ụtụ isi dị ire.

Eguzobela ụlọ ikpe na-ahụ maka ụtụ isi nke e tinyegoro n’ọrụ izu ụka atọ gara aga site n’aka odeakwụkwọ gọọmenti steeti Kogi bụ Dọkịnta Folashade Ayoade n’aha Gọvanọ Yahaya Bello nke Kogi steeti.

Enehe depụtara ihe ndị ọ rụpụtara n’oge ọchịchị ya nke gụnyere:
1,iweta usoro ịgba ụgwọ etiti,
2,itinye ​​​​ọdụ ụtụ isi n’isi ụlọ ọrụ gọọmentị ime obodo niile,
3,ịweta usoro njikwa ihe egwu kwesịrị ekwesị,
4,itinye nkanụzụ ọgbara ọhụrụ n’ọrụ, 5,inye ndị ọrụ onyinye nke 13th month,
6, ịkwụchapụ ụgwọ KGIRS Consultancy,
6,na-aga n’ihu na-enye ndị ọrụ ọzụzụ nakwa
7,ịtinye igwe ọkụ 33KVA Generator n’isi ụlọ ọrụ KGIRS.

Ike Umenaba

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *