Take a fresh look at your lifestyle.

Ndị uweojii ahụla nwoke nwe ọtụtụ akpa naịra ochie na-efegharị na soshal mịdịa

0 456

Ndị uweojii na Benue Steeti akọwaala ihe gbasara akwụkwọ ego naịra merela ochie nke a hụrụ n’ogige ndị ndị uweojii dị na mpaghara Wadata na steeti ahụ, bụ nke onyonyo ya na-efegharị na soshal midia ugbua.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Benue Steeti bụ Sewuese Catherine kọwara na ọ bụ n’ụbọchị Tuzde, abalị iri na atọ nke ọnwa Disemba ka ha nwetara ozi ahụ ma ziga ndị nnyocha ha ịga mata ebe akwụkwọ ego naịra ochie ndị ahụ si.

“Ndị nnyocha anyị chọpụtara na ọ bụ n’otu ụlọahịa dị n’ogige ‘barracks’ Wadata ka a hụrụ ego ochie ndị ahụ juru n’ọtụtụ akpa.

“Oge anyị kpọrọ onye nwe ụlọahịa ahụ bụ Isah Solomon ka ọ bị zara ọnụ ya, o kwuru na o nwere ikike site n’aka ụlọakụ etiti inyere ha aka jikwaa ego ndị merela ochie.

“Nwoke ahụ gosikwara anyị akwụkwọ ikike (license) nke ụlọakụ etiti nyere ya, ma kọwaa na akwụkwọ ego ndị ahụ merela ochie ma mebie so n’akụrụngwa nke ha na-emegharị iji nweta ọgwụ e ji achụ anwụnta,” Sewuese Catherine kọwara.

Ọ gara n’ihu kwuo na ha ezigarala ndị ụlọakụ etiti ajụjụ iji mata n’ezie ma ihe Isah Suleiman kwuru ọ bụ eziokwu.

Onyonyo a na-efegharị ugbua abụghị nke mbụ ndị mmadụ na-egosi ego naịra mebirila emebi nke a na-achọ ịga kwọrịe.

Ndị mmadụ na-ekwu na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị zoro ego ndị ahụ ma gbachi nkịtị ka ha mebie kama ha ga-eji ya enyere ndị nọ na mkpa aka.

N’ọdị nso a, onyonyo fesakwara nke gosiri ebe otu nwoke na-asụ asụsụ hausa na-ekwu na ya nụrụ ọtụtụ ego naịra rere ure nke jupụtara n’ime otu nnukwu ụgbọala ‘trailer’ nke a na-aga ịkwọri akwọri.

Kedu etu e si emebi akwụkwọ naịra merela ochie?

N’ọnwa Febrụwarị afọ 2020, ụlọakụ etiti kwuru na ha ga-akwụsị ịgba ego ochie mebirila emebi ọkụ, kama ha ga-achọ ụzọ ọzọ sayensị kwadoro iji jiri ego ochie ndị ahụ mepụta ihe ọzọ, nke bekee na-akpọ ‘recycling’.

Ha kwuru na ego ochie karịrị otu narị tonne ka ha mebiri site n’imunye ha ọkụ, mana ugbua, ha ga-akpọ oku ka ụlọọrụ ndị nwereike iji ihe ochie rụpụta ihe ọhụrụ bịa tinye akwụkwọ iji nweta ikike ị na-emegharị akwụkwọ ego naịra merela ochie.

“Anyị achọpụtala na ‘recycling’ bụ ụzọ kacha mma iji wepụ akwụkwọ ego ndị merela ochie, karịa ịkpọ ha ọkụ. Maka na ịkpọ ego ọkụ na-ewulite mmebi ihu eligwe, mana iji ego ochie ndị a emepụta ihe ọzọ ga-aka mma maka okirikiri anyị, bịakwa nye aka na mwulite ọnọdụ akụnụba obodo anyị,” CBN kwuru.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.