Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ise dị n’ime ‘Manifesto’ ndị Labour Pati ji azọ ọkwa Onyeisiala na 2023

0 272

Aka chịburu Anambra steeti ma bụrụkwa onye na-azọ ọkwa Onyeisiala Naịjirịa n’otu ‘Labour Party’ bụ Peter Obi ewepụtela akwụkwọ ihe o bu n’obi ime ma o merie ya bụ ọkwa ọ na-azọ.

Nke a na-abịa dịka ọtụtụ katọrọla ndị Labour Party maka na ha ewepụtabeghị ‘manifesto’ ha, n’agbanyeghị na ndị ọzọ welitere isi na-azọ ọkwa Onyeisiala ewepụtechaala nke ha.

Bola Ahmed Tinubu nke pati ‘All Progressives Congress’ (APC) wepụtara manịfesto nke ya ọ kpọrọ ‘Renewed Hope’ n’ụbọchị 21 nke ọnwa Ọktoba, n’Abuja; Abubakar Atiku nke ‘Peoples Democratic Party’ (PDP) ewepụtakwala manifesto nke ya nke ọ kpọrọ ‘My Covenant with Nigerians’; ebe Omoyele Sowore nke pati African Action Congress (AAC) wepụtara manịfesto nke ọ kpọrọ ‘A People’s Manifesto for Total Liberation’.

Mana n’ụbọchị Satọde, abalị anọ nke ọnwa Disemba 2022, ka Peter Obi kwupụtara n’akara Twitter ya, na ha ewepụtela ya bụ akwụkwọ manifesto.

Ọkpụrụkpụ ihe dị na Manịfesto a

Labour Party kwuru na ha chịkọtara ihe niile ha bu n’obi ime n’isiokwu asaa, iji weta ezi ọchịchị na Naịjirịa. Isiokwu asaa ahụ gụnyere:

  • Iweta ezigbo nchekwa na Naịjirịa, kwụsị mwakpo ndị ‘bandit’ na ndị ekperima, jikọọ Naịjirịa, ma mee ka a hapụ inwe ndị ọbụla a ga-ahapụ.
  • Ịkpọpụ Naịjirịa na mba e ji oriri mara ka ọ bụrụzie mba e ji mmepụta ihe mara, site n’iwulitegharị ngalaba nkọpụta nri nakwa ọtụtụ ihe ndị a ga na-ebupu si Naịjirịa gaa mba ọzọ.
  • Ịhazigharị usoro ọchịchị site n’ụzọ iwu nakwa ime ka ikpe nkwụmọtọ guzosie ike, ibusi agha ike megide nrụrụaka, ibutulata ego a na-emefu n’ọchịchị, nakwa ihibe ngalaba ndịọrụ gọọmentị nke dị uchu ma guzo n’eziokwu.
  • Ime ka Naịjirịa banye n’agba ‘Industrial Revolution’ nke anọ, site n’ịgbaso sayensị na teknụzụ ọgbara ọhụrụ iji hibe ọnọdụ akụnụba bụ ọkaibe.
  • Ịrụ akụrụngwa bụ ọkaibe maka inweta ezi ọkụ latrik, njem ụgbọ oloko, okporoụzọ, na njem ụgbọelu, nakwa okporo mmanụ agbịdị, site na njikọ aka ọnụ nke gọọmentị na ndị nkịrị.
  • Ịkwalite ikike ndị ntorobịa Naịjirịa iji rụpụta ihe ga-abụ ọkaibe n’ụwa niile site n’itinye ego n’agụmakwụkwọ, nnyocha, ezi ọnọdụ ahụike, na mmụta iji ego achụ ego
  • Iwulite ọnọdụ ọdịmma n’etiti Naịjirịa na mba ndị ọzọ ọ kachasị mba ndị dị n’Afrịka, nke ga-eme ka a na-asọpụrụ ikike dịịrị ụmụ Naịjirịa bi na mba ofesi, nakwa ihe niile Naịjirịa ndkwa ndị Naịjirịa nwere na mba ụwa dị icheiche ebe ha si enweta ego.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.