Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ndị ekperima si wakpo ụlọekpere ndị alakụba tọrọ ọtụtụ mmadụ

0 521

Ndị ekperima amaghị ndị ha bụ awakpola ụlọeukpere ndị ụka alakụba dị n’obodo Funtua, na Katsina steeti ma tọrọ ọtụtụ ndị na-ekpe ekpere ebe ahụ.

Akụkọ kwuru na nke a mere n’abalị ụbọchị Satọde dịka ndị mmadụ gbakọrọ na ‘mosque’ ahụ ikpe ekpere abalị.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Katsina steeti bụ Gambo Isah gwara ndi ntaakuko na onyeisi ‘mosque’ ahụ na otu onye ọzọ so na ndị merụrụ ahụ na mwakpo ahụ, mana ha esila n’ụlọọgwụ ebe ha gara ịnata ọgwụgwọ laa.

Isah kwuru na ndị uweojii na ndị agha gbara mbọ ma zọpụta ụfọdụ n’ime ndị ahụ a tọọrọ, mana ihe ruru mmadụ iri na atọ ka na-efu efu.

Kama o kwere nkwa na ha na-agba mbọ ịchọta ebe ndị ekperima ahụ zoro iji zọpụta ndị niile ahụ a tọọrọ.

Mwakpo ndị ekperima a kpọrọ ‘bandits’ na-arị elu nke ukwuu na mpaghara Ugwu Naịjirịa, n’agbanyeghị nkwa gọọmentị etiti na-ekwe ime ka ọnọdụ nchekwa kawanye mma.

Leave A Reply

Your email address will not be published.