Take a fresh look at your lifestyle.

Naijiria Ga-ekpughe Robot Mbụ N’Afrịka

Na'ankwat Dariem dere ya na Bekee

0 662

Naijiria ga-ekpughe Robot mbụ n’Afrịka nke aha ya bụ Omeife.

Ihe mkpughe a ga-ewere ọnọdụ na Fraịde abalị abụọ nke ọnwa Disemba 2022 n’Abuja, isi obodo Naijiria.

Robot ahụ nke ogologo ya dị 6-feet bụ ihe yiri mmadụ ma na-asụ asụsụ dị iche iche bụ Uniccon Group, ụlọ ọrụ nkanụzụ Naijiria nwere isi ọnọdụ ya n’Abuja, rụpụtara ya.

Uniccon Group bụ otu n’ime ụlọ ọrụ nkanụzụ ọhụụ na-eto ngwa ngwa n’ime Naijiria nke na-enye ụsa aka mgba nkanụzụ maka azụmaahịa nakwa ụlọ ọrụ gọọmentị n’ime Afrịka.

Ngalaba nkanụzụ n’ime Naijiria na-etowanye eto ma na-eme inweta na ikesa ozi, atụmatụ na azụmahịa ịdị mfe karịa.
Ọbụghị naanị nke a, ihe ọhụrụ ndị ụlọ ọrụ nkanụzụ Naijiria mere na-eme obodo a ịpụta ihe karịa.

Omeife bụ Robot mbụ nke Afrịka nke nwere ọdịdị dị nso na mmadụ, ikike asụsụ, mmegharị na omume ọgụgụ isi site na iji Artificial Intelligence na Computer Vision capabilities.

Ọ bụkwa Robot na-enye aka ime ọtụtụ ihe dị ka e mebere ya ka ọ nwee nghọta miri emi banyere omenala na ụkpụrụ omume Afrịka. Omeife nwere ike ịsụ asụsụ asatọ dị iche iche ma ewezuga asụsụ Bekee. Asụsụ ndị a gụnyere Yoruba, Hausa, Igbo, French, Arabic, Kiswahili, Pidgin, Wazobia na Afrikaans.

Ebu ụzọ kpughee Omeife na Gulf Information Technology Exhibition (GITEX) na Dubai, site n’aka Mịnịsta Naijiria na-ahụ maka nzikọrịta ozi na akụnụba ọgbara ọhụụ, Prọfesọ Isa Pantami, bụ onye toro mbọ Uniccon Group na ịkwalite amụma nka na ụzụ n’Afrịka.

Pantami kwuru na Naijiria na-enye ohere ọma iji kwalite amụma ọhụrụ na gburugburu azụmaahịa na mba ahụ.

N’ikwu okwu ya maka ịrụpụta Omeife, onye isi Uniccon Group of Companies, Maazị Chucks Ekwuene kwuru na achọpụtara Afrịka maka mbọ ya na nkanụzụ mba ụwa.

O kwuru, “Site na Omeife na ọrụ anyị ndị ọzọ , anyị nwere obi ụtọ isonye n’inyere ndị azụmaahịa na ndị mmadụ n’Afrika niile aka imezu ike ha niile site n’inye ohere nkanụzụ kachasị ọhụrụ maka ịrụ ọrụ nke ọma”.

Mmemme mkpughe ahụ nke akpọrọ “The Future of Artificial Intelligence in the African Tech Ecosystem” ga-egosipụta ndị isi nkanụzụ, ndị ndọrọndọrọ ọchịchị, na gọọmentị n’ịhazi ọdịnihu nke nkanụzụ n’Naijiria dịka ekpughere Robot mbụ nke Afrịka n’Naijiria. Ọ ga-ebulitekwu akara ngosi ọganihu nke nkanụzụ na mba ahụ.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.