Take a fresh look at your lifestyle.

Osote Onye Isi Ala Ga-Ezute Ndị Ndu Vietnam na Hanoi

Cyril Okonkwo dere ya na Bekee

0 163

Osote onyeisiala Naijiria, Ọkammụta Yemi Osinbajo, na-ahapụ Abụja na Satọde gaba Rịpọblik nke Vietnam maka njikọ aka mba na mba.

Ọnụ na-ekwuchitere osote onyeisiala, Laolu Akande bụ onye kwuru nke a n’ozi o zipụtara, o kwuru na ọrụ Osinbajo na mba Vietnam ga-agụnye nzukọ ya na Onyeisiala mba Vietnam, Nguyễn Xuân Phúc; Osote onyeisiala, Vo Thi Aah Xuan, Prime Mịnịsta, Pham Minh Chinh, ndị ọrụ gọọmentị na ndị azụmahịa.

Akande kwuru na njem nke osote onyeisiala na Vietnam ga-eme ka azụmahịa na mmekọrịta dị n’etiti mba abụọ ahụ siwanye ike.

Dị ka Akande si kwuo, onye bụbu osote Prime Mịnịsta mba Vietnam, Vuong Hue, bịara ala Naijiria n’ọnwa Ọktoba afọ 2019, wee zute Ọkammụta Osinbajo, ndị isi gọọmentị ndị ọzọ ma sorokwa ndị otu azụmahịa mba abụọ ahụ kpakọrịta maka nkwalite azụmahịa na mmekọrịta dị n’etiti mba abụọ ahụ.

“Dịka Osote Prime Mịnịsta n’oge ahụ, nke ndị isi gọọmentị na ndị oji ego achụ ego mba Vietnam so bịa Naijiria, kwuru na Nigeria bụ nnukwu onye otu azụmaahịa mba Vietnam n’ime Afrịka niile. N’ezie ọnụ ego ahia dị n’etiti mba abụọ ahụ guzoro na narị nde dollar abụọ na iri asatọ n’afọ 2014 wee rute ihe karịrị narị nde dollar ise n’afọ 2019.

“Ọ bụ ezie na Naijiria na Vietnam nọgidere na-enwe mmekọrịta mba na mba ogologo oge kemgbe afọ 1976, Osote Onyeisiala Osinbajo ga-abụ onye isi gọọmenti Naijiria nke abụọ na-aga mba ahụ ka Onyeisiala Olusegun Obasanjo gachara na afọ 2005.

“Mgbe ọ nọ na mba Vietnam, a na-atụ anya na osote onyeisiala ga-ebinye aka n’akwụkwọ nkwekọrịta itinye ego azụmahịa n’etiti Naijiria na Vietnam.

“Ọ ga-enwekwa mkparịta ụka dị elu ya na ogbo ya nke Vietnam, Vo Thi Aah Xuan na Prime Mịnịsta maka okwu azụmahịa, ọrụ ugbo, nkanụzụ na ndị ọzọ.”

Ọnụ na-ekwuchitere osote onyeisiala kwukwara n’ozi ahụ na Osinbajo ga-emesịa sonye na nzukọ azụmahịa nke ndị nnọchiteanya si mba abụọ ahụ nọ n’ime ya.

“Site na ohere dị n’ọrụ ugbo na nkanụzụ n’ime Naijiria na Vietnam, mkparịta ụka ga-elekwasị anya n’uru sitere na mmekorita na mpaghara ndị a iji mee ka mmekọrịta enyi na enyi na azụmahịa nke mba abụọ a mikwuo emi.”

Akande kwuru na osote onyeisiala ga-eweta njem nleta na Vietnam na njedebe n’ụbọchị Wednezde.

 

Ike Umenaba

Leave A Reply

Your email address will not be published.