Take a fresh look at your lifestyle.

Ntuli Aka 2023: Onye Na-Azọ Ọkwa Onyeisiala Na APC Ga-Eme Ka Akụnaụba Naịjirịa Kwalite

Moses Nwite

0 391

Onye ndọrọ-ndọrọ ọchịchị nke All Progressives Congress APC, Ahmed Bola Tinubu ekwela nkwa imeziwanye akụnụba Naijiria ma ọ bụrụ na a họpụta ya dị ka onyeisiala nke mba ahụ na ntuli aka na-abịanụ.

Mazị Tinubu kwere nkwa a n’oge a na-achụ nta vootu n’Abakaliki bụ isi obodo steeti Ebonyi.

Onye na-azọ ọkwa onyeisiala gwara ndị ndịda-ọwụwa anyanwụ Naijiria ka ha kwado ya na ndị ọzọ na-azọ ọkwa ọchịchị n’aha All Progressives Congress (APC) .

“Ọ bụrụ na ụnụ kwadoro anyị ka anyị nweta mmeri n’APC, ọchịchị anyị ga-eme ka ndịda ọwụwa anyanwụ Nigeria bụrụ Taiwan nke Africa”

“A ga-eme ka ọkụ latrik dịghachite n’ihi na a gaghị enwe ego ọkụ mmafe maka ndị Naijiria.” Ọ gbakwụnyere.

Agụmakwụkwọ

O kwuru na agụmakwụkwọ bụ ngwa ọgụ siri ike iji lụso ụbịam ọgụ, yabụ na gọọmentị ya ga-elekwasị anya na agụmakwụkwọ maka ndị Naijiria niile.
“Site n’ime nke a, a ga-ekpochapụ ụbịam n’Nigeria”. O kwuru.

Ọrụ

O kwere ndị Ebonyi na-enweghị ọrụ nkwa itinye ha n’ngalaba dị iche iche nke akụ na ụba Nigeria.

Onye isi oche APC n’Naijiria, Abdulahi Adamu, nke onye nọchitere anya bụ Emmanuel Enukwu gosipụtara ntụkwasị obi o nwere na ndị Naijiria ga-akwado ndị ga-azọ ọkwa ọchịchị na pati ahụ.

Gọvanọ steeti Ebonyi bụ Engr David Umahi kwuru na ndị Ebonyi adịla njikere ịtụrụ Tinubu na APC vootu.
Umahi kwuru na steeti ahụ bụ maka APC.

Ọzọkwa, onye na-azọ ọkwa gọvanọ na pati ahụ, Mr Francis Nwifuru na ndị ọzọ na-azọ ọkwa ọchịchị na steeti ahụ bụ ndị e nyere ọkọlọtọ nke pati ahụ.

Ihe pụtara ihe na mmemme ahụ bụ nnabata nke ndị otu ndọrọndọrọ People’s Democratic Party (PDP) gafere n’APC.

Onye jiri aha PDP zọọ ọkwa sinetị PDP n’Ebonyi Central Zone, Ambassador Franklin Ogbuewu, bụ onye kwuchitere ndị ọzọ kwere nkwa na ya ga-erubere pati ahụ isi.

Ekele

Onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka ọkụ na igwe, Chiifu Godwin Ogbaga kelere onye ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ maka nkwa niile o kwere ndị ndịda ọwụwa anyanwụ na ndị Naijiria n’ozuzu.

Ogbaga rịọrọ ya ka o were nkwado ndị Ebonyi nyere ya mee ihe.

Ọtụtụ ndị Gọvanọ nke pati APC bịara nzụkọ a.

 

Ike Umenaba.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *