Take a fresh look at your lifestyle.

Etu ụmụakwụkwọ abụọ’Michael Okpara University of Agriculture’ si si n’ụra fere n’ọnwụ

0 503

Ndị uweojii Abịa steeti ekwuola na ha na ọnwụ ụmụakwụkwọ mahadum ‘Michael Okpara University of Agriculture’ (MOUAU) Umudike, Abia Steeti abụọ nwụrụ n’ụzọ edobeghị anya na ngwụcha izuụka a.

Edeh Chinonso Mordecai, a ma dịka ‘Decency’ na ogbo ya a kpọrọ Victor Ụkpai labara ụra, ha eteghị dịka a hụrụ ozu ha na mgbede Satode, abalị ise nke ọnwa Novemba afọ 2022.

Mordecai nke ngalaba ‘Animal Science and Animal Production’ na Victor nke ngalaba ‘Environmental Management’ bi na ebe obibi ụmụakwụkwọ a kpọrọ Wisdom Lodge dị n’Umudike.

Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ bụ ka mmadụ chọtara otu n’ime ndị ahụ nwụrụ anwụ ka hụrụ ozu ha.

Otu nwata akwụkwọ mahadum ahụ gwara ndi ntaakụkọ sị, ” Otu onye metụtara otu n’ime ha kpọrọ ya n’ekwentị ugboro ugboro, ọ zaghị.”

“Ọ chọọrọ ya gaa ebe o bi, kụọ aka mana ọ kpọpeghị ụzọ.”

” O siri na mpịọ ụlọ nyoo ma hụ ozu ha abụọ, were tiwe mkpu, onye nlekọta ụlọ ahụ na ndị agbataobi gbatara.”

“Ha bekuru ndị nche mahadum ahụ, ha gbawaa ụzọ.”

Akụkọ na-efegharị na soshal midia na-ebo ebubo na e tinyere ha nsi na nri.

Dịka akụkọ ahụ siri kwuo, mmadụ abụọ ahụ richara nri nke ha zigara onye ọkada ha zụtara ha, laba ụra mana ha eteghị.

Ebe akụkọ ọzọ na-ekwu na ọnwụ ha metụtara ntuliaka otu ụmụakwụkwọ mahadum ahụ a ga-eme n’izuụka na-abịa nke a si otu onye n’ime na-azọ ọkwa .

Mana ọnụ na-ekwuru mahadum ahụ MOUAU bụ Adamma Odefa, onye gwara ndi ntaakuko n’ekwentị na ụmụakwụkwọ ha nwụrụ n’ezie kwuru na ha amaghị ihe gburu ụmụakwụkwọ ha nke ha na-ama etu ha siri nwụọ.

Odefa sịrị : “Anyị amaghị ihe mere.”

“A hụrụ ozu ha n’ebe obibi ha, ndị uweojii ebugala ozu ha ụlọozu.”

“Anyị ga-ezigara ndị ezinaụlọ ha ozi.”

N’aka nke ọzọ, ọnụ na-ekwuru otu na-achịkọta ụmụakwụkwọ mahadum(SUG) bụ Chijioke Emmanuel kwuru na o nweghị eziokwu dị n’akụkọ ahụ dịka a ka na-eme nnyocha ihe mere.

Emmanuel kwuru sị,” Ndị na-efesa akụkọ ahụ amaghị ihe ha na-ekwu.”

” Otu ọbaozi kwuru na ọnụ na-ekwuru otu na-achịkọta ụmụakwụkwọ MOUAU anwụọla, ọ bụghị eziokwu, ọ bụ m bụ ọnụ na-ekwuru otu ụmụakwukwọ mahadum anyị , adị m ndụ.”

” Nwa amadi ahụ nwụrụ bụ Mordecai Edeh bụ ọnụ na-ekwuru ụmụakwụkwọ ngalaba ‘College of Animal Science and Animal Production'(CASAP) bụ ihe ọ na-agụ na mahadum anyị.

“O soghị azọ ọkwa ọbụla na SUG. Echeghịdị m na ọ na-azọgharị ọkwa ọnụ na-ekwuru CASAP.”

Ndị uweojii na steeti ahụ kwuru na ha na ndị ọrụ ha eburula ozu ụmụakwụkwọ abụọ ahụ, ebe nnyocha na-aga n’ihu.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Abịa steeti bụ Geofrey Ogbonna gwara ndi ntaakụkọ na onye gbara ndị uweojii ama ihe mere bụ onyeisi ndị ọrụ ncheta mahadum ahụ.

O kwuru na “Ozu mmadụ abụọ ahụ nọ n’ụlọ ebe a na-echekwa ozu.”

“Nnyocha ebidola.”

” Nnyocha ahụ nwere ike ịgwa anyị ma ọbụ anwụrụ si n’igwe na-enye ọkụ ka ọ bụ ihe ha riri ahụ n’ihi na o nwewre ihe a na-eriiri fọdụrụ ebe ahụ.”

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *