Take a fresh look at your lifestyle.

Etu Chibuike Napoleon siri malite ọrụ idugharị ndị ọbịa n’ogige ụmụanụmanụ

0 776

Otu nwata nwere mmasị n’ụmụanụmanụ a kpọrọ Chibuike Napoleon akọwaala etu o si malite ịrụ ọrụ dịka onye na-edugharị ndị ọbịa bịara n’ọgịge ebe ana aelekọta anụmanụ.

Nwatakịrị a dị afọ iri na otu kwuru na mkparịtaụka na ọ bụ ka ọ gbara afọ isii ka ọ malitere ọrụ a.

O siri, “M gacha ụlọakwụkwọ lọta, mecha ihe m na-eme n’ụlọ, a gawa m ogige ụmụanụmanụ.”

O kwụrụ na ọ ga-amasị ya ịgụ akwụkwọ maka dọkịta ụmụanụmanụ, iji nye ya ohere ịna-eleta ha ma ha daa n’ọrịa.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *