Take a fresh look at your lifestyle.

Egbuola mmadụ iri na otu ebe a na-azụ ndị agha ọhụrụ mba Rọshịa

0 773

Egbuola mmadụ iri na otu n’ogige a na-azụ ndị batara ọhụrụ dịka ndị agha mba Rọshịa na mpaghara Belgrood n’ụbọchị satọde.

Ọ bụ n’ogige a na-akuziri ndịa etu esi agba egbe ka mmadụ abụọ wakporo ebe ahụ.

Ndị a emechara gbuo oge mwakpo a merụwakara mmadụ iri na ise ọzọ ahụ.

Ngalaba nchekwa nke mba Rọshịa kwuru na mmadụ abụọ sị na mba ndị nọbu n’okpuru Soviet Republic.

Nke a na-eso iwu onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin ka ahọpụta mmadụ 300,000 ọzọ dịka ndị agha mba ahụ.

Nke a butere ọtụtụ nsogbu na ngagharịiwe iwe na mba Rọshịa.

Rọshịa wakoro mba Yukren n’ọnwa Febuwarị nke afọ 2022 maka ebubo na a na-akpa oke agbgụrụ na mba ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *