Take a fresh look at your lifestyle.

Queen Elizabeth II: Ntuziaka sịte n’ụbọchị ruo n’ụbọchị maka ya

0 371

Igbe ozu Ezenwaanyị Elizabeth II esila Balmoral rute Edinburgh iji malite emume nkwanyeugwu ikpeazụ tupu olili ya n’ụbọchị Mọnde 19 nke ọnwa Sepụtemba.

Ndị mmadụ ga-enwe ohere inye Ezenwaanyị nsopụrụ ikpeazu, dịka a ga-edowe ozu ya na Obieze Holyroodhouse na Westminster ebe ndị mmadụ ga-enwe ike ịhụ ya – omenala eji ‘Laying in state’ mara na bekee.

Eze Charles III ga-eme njem nleta mba anọ ndị mejupụtara UK.

Lee ntuziaka site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị maka akwamozu Ezenwaanyị

Igbe ozu Ezenwaanyị Elizabeth nke eji osisi oka rụọ ga-anọ na ebe a na-eme mmemme nke nọ na Balmoral Castle, ebe a ka ndị nchekwa ya ga-eburu ya tinye n’ime ụgbọala eji ebu ozu.

Ozu ya ga-ahapụ Balmoral n’elekere 10:00 BST, jiri nwayọ nwayọ bido njem nke ga-eji awa isii ruru mile 175 n’ụzọ eji aga Edinburgh.

Ị ga-ahụta mapụ njem a nke ga-agafe Aberdeen, Dundee na Perth A full map of the route, which will pass through the cities of Aberdeen, Dundee, and Perth, ce Ebea.

Igbe ozu ya ga-agarute Obieze nke Holyroodhouse – ndị dị n’isi obodo Scotland bụ ebe obibi ndị Eze mba Briten – ma debe ahụ ya n’ụlọ ocheze.

Na London, Eze Charles nke III na ode akwụkwọ ukwu nke otu mba Commonwealth ga-enwe nzukọ. Mgbe emechara, ọ ga-ele kọmịshọna nnọchite anya ndị mba Commonwealth ọbịa na ogige Bow RoomEze ga-eji njem nleta were bido ụbọchị na Westminster Hall, ebe ndị omeiwu nta ga-ezute maka mgbaru.

Eze na Nwunye Eze bụ Camilla ga-eji ụgbọelu gaa Edinburgh. Nke a sọ na-emume Operation Spring Tide, nke bụ aha nzuzo a na-akpo njem nelta mba anọ ọ ga-eme dịka Eze.

N’ehihe, a ga-eso n’ahịri were duru igbe oz Ezenwaanyị gawa ụloụka St Giles, dịka Eze na ndị ezinụlọ Eze niile ga-eso.

Mgbe emechara, Eze ga-alaghachi Obieze Holydrood House ebe ya na mịnịsta mbụ mba Scotland bụ Nicola Sturgeon ga-enwe nzụkọ.

Eze na Nwunye Eze ga-eso gaa emume ebe ndị omeiwu Scotland ga-enye ha ozi mgbaru ha.

N’abalị, Eze Charles na ndị ezinụlo eze ga-eme emume imu anya abalị n’ụloụka St Giles.

Adaeze Anne bụ naanị nwa nwaanyị Ezenwaanyị ga-eso igbe ozu Ezenwaanyị site na St Giles gawa ọdọ ụgboelu Edinburgh ma sịte ebe ahụ gawa RAF Northolt.

A na-atụanya na njem ụgbọelu ikpeazụ nke Ezenwaanyị site Scotland gawa London ga-erute tupu ọ kụọ 19:00.

Site ebe ahụ, ọ ga-eme njem gawa Obieze Buckingham. Eze na nwunye Eze bụ Camilla ga-anọ mgbe a ga-anata ya tupu edowe ya na Bow Room.

Tupu nke a eme, Eze na Camilla ga-eme njem gaa Belfast nke dị na mba Northern Ireland. Ha ga-esi ebe a gawa Hillsborough Castle maka emume na-egosi mmekọ ezenwaanyị na mba Northern Ireland.

Mgbe emchara Eze na ọda akwụkwọ mba Northern Ireland bụ Chris Heaton-Harris na ndị ọchịchị patị ga-enwe nzụkọ. Eze ga-anata kwa ozi iti aka n’obi nke onyeisi ndị omeiwu mba Northern Ireland bụ Alex Maskey MLA.

Mgbe Eze na ndị ọchịchị okpukperechi nwe chara nzụkọ, Eze Charles na Camilla ga-aga ụke ekpere pụrụiche na ụlọụka St Anne tupu ha alọghachị London.

Ndị obodo ga-edu ahụ Ezenwaanyị site Buckingham Palace gawa Westminster dịka okụchara 14:00.

A ga-eji ụgbọ eji ebu nnukwu egbe nke ndị agha Eze nke Royal Horse Artillery, ndị agha na ndị ezinụlọ Eze ga-eso kwa ya.

Eze Charles ga-edu ndị a dịka ọ ga-eso igbe ozu a n’azụ, nke a ga-eji okọlọtọ Royal Standard kpuchie.

Igwe mmadụ nwereike ilele njem a dịka ha si Queen’s Garden, The Mall, Horse Guards, Horse Guards Arch, Whitehall, Parliament Street, Parliament Square na New Palace Yard.

A na-eche na njem a ga-ewe nkeji iri ano.

A ga-enwe nnukwu ihe onyonyo maka emume a na capital’s Royal Parks.

A ga-edowe igbe ozu ya, na-ebe dị elu nke a na-akpọ Catafalque, n’okpuru Imperial State Crown, orb na sceptre, na Westminster.

Ndị agha nke Roral Household ga-echekwa akụkụ ebe a niile oge niile n’ụbọchị.

Archbishop nke Canterbury bụ Justin Welby ga-aka ụka obere oge nke Eze Charles na ndị ezinụlọ eze ọzọ tupu enye ndị ọha ohere ịbata.

Nke a bụ ụbọchi mbụ n’ime ụbọchị anọ Ezenwaanyị ga-anọ na Westminster, ebe ọ ga-anọ ruo ụtụtụ mgbe a ga-eme emume olili mba.

A ga-emechi igbe ozu ya ma dowe ya n’ebe dị elu nke ga-enye ndị mmadụ ohere ịgafe ma kwanyere ya ugwu ikpeazụ.

Ekwuputebeghị etu ọ ga-esi aga, kama a na-atụ anya na narị puku mmadụ ga-abata n’ime ụlọ a rurula afọ narị iri na otu, bụ ebe kacha dị ochie n’ime Obieze nke Westminster nke bụ isisekpụ ntị ọchịchị mba Briten.

Nke a bụ omenala ndị Eze, Nwunye Eze nke a na ndị nwụrụ na mbụ, ụfọdụ mgbe ndị ọchịchị gọọmentị – kama enwebeghị Praịm Mịnịsta ehiwetụrụla ebe a ewepụ Winston Churchill n’afọ 1965.

Igbe ozu Ezenwaanyị ga-anọ abalị abụọ ọzọ na Westminster Hall, ebe ndị mmadụ ga-abịa kwanyere ya ugwu ikpeazụ.

Eze na Camilla ga-aga Wales, nke a bụ njem nleta ikpeazụ ya nke mba anọ mejupụtara United Kingdom dịka Eze.

Igbe ozu Ezenwaanyị ga-anọ abalị atọ ya na Westminster Hall.

Igbe ozu Ezenwaanyị ga-anọ abalị anọ zuruoke na Westminster Hall.

N’ụtụtụ ka ngosipụta igbe ozu Ezenwaanyị ga-akwụsị, a ga-ebu ozu ya gaa Westmisnter Abbey maka olili mba ya, ụbọchị a bụ ụbọchị ezumike nke ụlọakụ agaghị emepe.

Ndị ọbịa a na-atụ anya ga-eso ezinụlọ Eze bụ ndị isi ndọrọndọrọ ọchịchị UK na ndị isi ala mba ụwa bịaranụ.

Mgbe emechara emume a, a ga-eso igbe ozu ya site Westminster Abbey gaa Wellington Arch, ma site ebe a gawa Windsor.

Ụgbọala ga-ebu igbe ozu ya site Long Walk gawa ụlọụka St George dị na Windsor, ebe a ga-aka ụka pụrụiche maka olili ya.

 

Leave A Reply

Your email address will not be published.