Take a fresh look at your lifestyle.

Etu onye ‘ngwọrọ’ si bilie gbaa ọsọ mgbe anyị na-achụ ndị ‘ara’ n’Owerri – ENTRACO

0 537

Ngalaba Gọọmentị Imo Steeti na-ahụ maka obodo ịdị ọcha bụ Environmental Transformation Commission (ENTRACO) ekwuola ihe mere ha ji ekpochapụ ndị e chere bụ ndị ara na ndị arịrịọ juru n’okporoụzọ dị n’Owerri.

Onyeisi ngalaba a bụ Nkem Frank Nzenwodo gwara nhdi ntaakukọ na ọtụtụ ndị ha chere bụ ndị ara nọ n’okporoụzọ Owerri abụghị ndị ara.

“Mgbe anyị chụpụchara ndị na-ere ahịa n’okporoụzọ Douglas Owerri, anyị chọpụtara n’ụfọdụ ndị e chere bụ ndị ara kwụcha n’ụzọ ahụ bụcha ndị isi zuru oke.

“Ụfọdụ n’ime ha mere ka ndị ngwọrọ na ndị kpuru isi na-arịọ arịrịọ, mana e nweghi ihe ọbụla mere ha”

“Nke tụrụ m n’anya bụ mgbe anyị chọrọ inwuchi otu onye, onye ngwọrọ ọzọ nọ na ‘wheel chair’, biliri n’ụkwụ ya abụọ ma rie mbọmbọ ọsọ.”

“M wee tie mkpu na ihe ịrịbaama emeela na Douglas”.

Nzenwodo gara n’ihu kwuo na nnyocha ọzọ ha mere gosiri na ọtụtụ n’ime ndị a na-eche na ha bụ ndị ara, bụcha ndị ohi na-akpa ike n’Owerri.

Ọ sị na mgbe ha na-achụ ndị a ọsọ, na ha hụrụ ngwa egbe na akpa ọgwụ bụ nke ha ji akpa ike.

Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụ ọtụtụ ndị okenye a sị na ara na-ayị ha n’okporoụzọ na-atụwa ụmụnwaanyị ime.

Kedụ ebe a na-ebuga ndị ha nwuchiri?

Nzenwodo sị n’ime ụfọdụ ndị ha jiderela, ha chọpụtara na isi zuru ha oke.

“Ndị niile anyị nwuchirila ahụ dịcha ha mma site n’ajụjụ anyị jụrụ ha.

“O nwere nke sị na ọ bụ onye Mbaitoli na ọ bụghị onye ara. Anyị na-akpọla ha obodo ha si bịa.”

O kwukwara na ha ga-esi n’Owerri bụ isi obodo Imo Steeti zachaa ma kpochapụ ndị ara niile banye n’obodo ndị ọzọ.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *