Take a fresh look at your lifestyle.

Etu di, ndị lụrụ dinanwunye si nwụọọ n’ụzọ edoghi anya

0 581

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Enugwu Steeti bụ Daniel Ndukwe edepụtala akwụkwọ ozi maka ọnwụ mmadụ isii nwụrụ n’obodo Adani.

Ha kwuru na gụnyere mmadụ isii ahụ nwụrụ, mmadụ asatọ ọzọ nọ n’ụlọọgwụ anata ọgwụgwọ n’ihe ahụ mere nke dị n’okpuruọchịchị Uzo-Uwani, Enugwu Steeti n’ụbọchị Satọde.

Kọmịshịna steeti ahu bụ Ahmed Ammani ekwuola ka amalite nyocha ngwa ngwa banyere ya bụ ọdachi mere.

Cheta na akụkọ kwuru na onye agbataobi chọtara mmadụ asaa gụnyere di na nwunye na ndị ọbịa ha ebe ha kubiri n’imeụlọ dịka ha si emume alụmdinanwunye ha lọta.

Onye agbataobi ahụ tipuru mkpu enyemaka nke mere ka eburu ndị ahụ gawa ụlọọgwụ ebe nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ na mmadụ ise ọzọ nwụrụ.

Akụkọ kwukwara na nwunye ọhụrụ ahụ so na ndị na-anata ọgwụgwọ n’ụlọgwụ dị icheiche na steeti ahụ.

Ihe ndị uweojii chọpụtarala

  • Ọnwụ mmadụ isii a ezighị ezi, ọbụghị chi ha gburu ha.
  • Otu onye n’ime ndị a nwụrụ bụ Obinna Dike dị afọ iri atọ na otu, ọ mechara ịgba nkwụ ya n’abali iri abụọ na isii nke ọnwa Ọgụstụ a.
  • Mgbe ọ mechara, ya na ezinụlọ ya na ndị enyi ya lara n’ụlọ ma na-enwe kwa aṅụrị.
  • Dịka chi foro, enweghị onye ọbụla n’ime ha pụtara ezi n’ụtụtụ.
  • Nke a mere ka a gbaaka ụzọ ha, were hụ ka ha tọgbọ ma ihe ọfụfụ juru ha n’ọnụ.
  • E buuru ha gawa ụlọọgwụ ebe ekwuru na mmadụ isii n’ime ha anwụọla.
  • Mmadụ asatọ ndị nke ọzọ na-anata ọgwụgwọ nke ọma n’ụlọọgwụ

Ammani tiri ndị ezinụlọ ya bụ ihe metụtara aka n’obi ma sị ka mmadụ niile dere duu ma nyere ndị uweojii aka na nyocha ha.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *