Take a fresh look at your lifestyle.

Enwghi onye ami Mejọ ọbula agbagburu n’ Azia

0 496

Dịka akụkọ na-efegharị na soshal midia na ndị ojiegbe gburu otu onye agha welitere isi n’Azia dị n’Anambra steeti, onyeisi otu ụmụamala obodo ahụ ekwuola sị na o nweghị ụdị ihe a mere n’obodo ha.

N’ ụbọchị Tuzde, akụkọ fegharịrị na soshal midia nke ụfọdụ akwụkwọ akụkọ bukwara kwuru na ndị ojiegbe amabeghị ndị ha bụ gburu otu onye agha a kpọrọ Majọ Churchill Orji, onye Agulu Ụbọchịụka dịka ya ndị ọzọ gara ọrụn’Azia dị n’Okpuru Ọchịchị Ihiala.

‘Major bụ onye ji ọkwa gafere nke ‘captain’ mana onye ‘lieutenant colonel’ karịrị ya.

Akụkọ ahụ nke ekwụghị ka ya bụ ihe siri mee gara n’omere oge ọ gara ọrụ , kwuru na ọ bụ onye ya na ya gụkọrọ akwụkwọ sekọndịrị n’ụlọakwụkwọ ‘Agulu Boys Secondary School’ wepụtara ozi a n’akara Facebook ya.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambtra steeti bụ Tochukwu Ikenga kwuru na ya amaghị maka ya bụ akụkọ.

Mana Onyeisi otu Azia Town Union bụ Dr Tonna Nwabueze kwuru n’ozi o wepụtara ya bụ akụkọ bụ okpotokpo asị.

Ọ sịrị, “O nweghị amị Majọ e gburu n’Azịa.”

“Ụdị ihe a emeghị n’obodo anyị.”

” Ụdị ihe ọ bụrụ na o mere, ọ bụ ihe jọgburu onwe ya mana o meghị n’Azia.”

Ọ gara n’ihu rịọ ndị o kwuru na-etinye aha obodo ha n’ajọ akụkọ ka ha na-ajụ ese tupu ha ede akụkọ ma kwụsị ikesa akụkọ ụgha.

Kemgbe ọnwa Jenuwari afọ 2021, tigbuo-zogbuo na-akpatụ n’Ọwụwa Anyanwụ dịka ndị ojiegbe na-awakpo ndị ọrụnchekwa gụnyere ndị uweojii nakwa ndịagha, na-ebibi ogige ndị uweojii ma na-egbukwa ọtụtụ ndị welitereisi n’ala Igbo.

Ndị ọrụ nchekwa na-ebo otu Ipob na alakla ọgụ ha bụ Eastern Security Network Ebubo na aka ha dị na mkpamkpa ndị a.

Mana Ipob agọọla ugboro ugboro na aka ha dị ọcha.

Ụfọdụ a na-ezipụ akụkọ ụgha banyere ọdachi mere.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *