Take a fresh look at your lifestyle.

Ka ideba aha ọhụrụ si gaa n’ala anyi-Inec

0 689

Dịka ụlọọrụ na-ahazi ntuliaka bụ Inec n’ịchafụ kwụsịrị ndebanye aha maka akwụkwọ ikike ịtụ vootu, ha kwuru na ọnụọgụgụ ndị debanyere aha ha ọhụrụ dị nde iri na abụọ na ụma (12,298,944).

Dịka ozi dị n’ọbaozi intanet Inec si kwuo, ọnụọgụgụ ndị debanyere aha ha ọhụrụ n’Ọwụwa Anyanwụ kachasị pee mpe(1,441,156), ebe Ọdịda Anyanwụ Ugwu (2,514,273).

Saụt-saụt ji 2,458,095 eso ya, ebe Etiti Ugwu ji 2,314,368 eso ha. Ọdịọ̄a Anyanwụ( Southwest) nwere 2,039,982, ebe Ọwụwa Anyanwụ Ugwu (Northeast)1,531,070.

E lewe ndị denyere aha na steeti na steeti, Lagọs na Kano bụ steeti kachasị denye aha.

Legọs nwetara 585,620, Kano nwetara 569,103, ebe Delta steeti ji mmadụ 523,517.

Steeti ndị debanyere aha ọhụrụ pekachasịrị mpe bụ Yobe nke nwetara mmadụ 152,414, na Ekiti nke nwetara 124, 844 .

Inec mechiri ndebanye aha n’abalị iri atọ na otu nke ọnwa Julai afọ 2022 ma sị na ọ bụ na-emecha ntuliaka 2023 ka ha ga-amalirte idenye aha ọzọ.

Mana ọtụtụ ụmụ Naijiria nka na-akpọ oku ka a gbatịa ohere idenye aha maka ntuliaka.

Cheta na Inec nọrọ n’abalị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Juun malitegharịa ohere idebanye aha n’ịntanet , ebe nke ana ebe ihu na ihu n’ụlọọrụ ha malitere n’ abalị iri abụọ na isii nke ọnwa Julai afọ 2021 dịka e mechara ntuliaka 2019.

Leave A Reply

Your email address will not be published.