Take a fresh look at your lifestyle.

Ntuliaka 2023: Agwara ndi ntorobia ka ha kwado ezi onye ọchichi

0 774

Otu kwuru na nke onwe ya akpọrọ Messengers of Peace Advocacy group n’olu bekee agwala ndi ntorobia ala Naijiria ka ha tunyere onye tozuru oke akwụkwọ na ntuliaka maka ọdinma ala anyi.

Ma gwakwa ha ka ha wepu aka ọgbaghara bụ nke na nwere ike ibute nsogbu na ntuliaka nke afọ 2023 aga eme n’ala anyi.

Onye National Prezidenti nke otua bu, Mazi. Adejo Suleiman,kwuputara nke mgbe ana eme emume ichi ezenwanyi nke itolu na Abuja,isi obodo Naijiria.

Mazi. Suleiman kwuru na nkea ga enwe isi ma ọbụrụ na ndi ntorobia nweta voter cards (PVCs) ma gakwa binye aka n’akwụkwọ ntuliaka etu okwesiri.

Ọ gara n’ihu gwa ndi ntorobia ka ha hapu ita ndi ọchichi ụta kama taa onwe ha ụta maka ndala azu ezi ọchichi.

Leave A Reply

Your email address will not be published.