Take a fresh look at your lifestyle.

Ntuliaka Ebonyi: APC emeriela na okpuru ọchichi iri na atọ

0 632

Ntuliaka nke okpuru ọchichi emere na Steeti Ebonyi, ụlọ ọrụ n’ahụ maka ntuliaka elu nke akporo (Ebonyi State Independent Electoral Commission EBSIEC),kwuru na otu ndorondoro the All Progressives Congress (APC)merichara ọkwa onyeisioche okpuru ọchichi iri na atọ gunyere ọkwa ndi councillorship otu nari iri asaa na otu enwere na Steeti Ebonyi.

Onyeisioche EBSIEC bụ, Barrister Josy Eze,bụ onye kwuputara nkea etu okwe si gbaa na ntuliaka a n’isi obodo a bụ Abakaliki.

Eze kwuru na ntuliaka a gara nke ọma n’enweghi nsogbu ọbụla.

Ndi isioche ohurua gunyere; Ebere Nwogba (Abakaliki LGA); Chinedu Uburu (Ebonyi); John Onwe (Ishielu); Moses Ogodo Ali (Ezza North); Sunday Nwankwo (Ikwo); Euphemia Nwali (Ezza South); Chinonso Ajah (Ohaozara); Stephen Nwankpa (Izzi).

Ndi ọzọ bụ: Emmanuel Aja (Ivo); Chima Ekuma Nkama (Afikpo South); Uchenna Ibiam (Afikpo North); Ikechukwu Odono (Ohaukwu) and Chidiebere Uzor (Onicha).

Leave A Reply

Your email address will not be published.