Take a fresh look at your lifestyle.

Aghọgburu ya n’ime njem, O were daba n’ọnya site n’ọrụ mmanye siri ike– Agba nke abụọ.

Amarachukwu Nwanguma dere ya na bekee.

0 544

 

Aghọgburu ya n’ime njem, O were daba n’ọnya site n’ọrụ mmanye siri ike – Agba nke abụọ

.

 

Obinna bụ ohu na Saba.

Gụkwuo: Aghọgburu ya n’ime njem, kwere ya onya n’ọrụ mmanye –Agba nke mbụ.

Obinna  bụ onye enwechaghị ihuoma ka Azuka, bụ́ onye ezinaụlọ na-enwechaghị obi ọjọọ zụtara ya.

Ndị ji  mmadụ atụ mgbere resịri ya Mudi, onye Arab na-ere ohu bụ onye bu ya na ndị ọzọ e ji eji gaa Saba, Libya.

Mudi, dị ka ihe egwuregwu, kwuru ka ohu ọ bụla kwụọ ya puku dinar abụọ  ya bụ puku nari naira abụọ(N200,000) tupu ha e nwere onwe ha.

“Na mbụ echere m na ọ na-egwu egwu, m wee gwa ya na Maazi. Razaq akwụla ụgwọ maka njem m na Libya. Ọ gwara m na ọ na-eche banyere ego ya na ọ na-enye anyị naanị ụbọchị amara n’ihi na anyị bịarutere , mana ọ dọrọ aka ná ntị na anyị kwesịrị ime ka ego ya rute ya n’echi ya.

“Mgbe ọ bịarutere n’echi ya wee rịọ ka akwụọ ya ego ya ma ọ nweghị onye nwere ike ịkwụ ya, o bupụtara egbe gbagbuo Jagaban, nwa nwoke si Edo steeti o wee nwụọ ozugbo.

“Amalitere m ibe ákwá dị ka nwa ọhụrụ ma na-arịọ ya ka ọ hapụ ndụ m. Mazị Mudi nyere anyị ekwentị ya ka anyị kpọtụrụ ndị ezinaụlọ anyị ozugbo ma ọ bụ  o menye anyi egwu,” Obinna chetara.

Ọzọ, Obinna sị na ya kpọrọ nwanne ya nwaanyị bụ Uju, rịọ ya ka o bute ego ahụ ngwa ngwa ka e wee ghara igbu ya.

Ka ọ nọ na-eche ka a kwụọ ụgwọ ya bụ ego mgbapụta ahụ, Obinna kwuru na Maazị Mudi na ndị na-enyere ya aka na-akụ ndị ohu ahụ ihe . Ihe ndi ha ji akụ ha ihe ahụ bụ mma ,eriri na osisi ruo ógè otu onye n’ime ha gbawara ara ka akụrụ ya ihe n’isi.

Naanị mmadụ iri n’ime mmadụ iri na asaa e resịrị Mazị Mudi ka dị ndụ n’oge Obinna gbapụrụ n’ọnwa Septemba nke  afọ ahụ.

Mgbe nwanne ya nwanyị, Uju kwụrụ ụgwọ, a kpọrọ ya ka ọ tọhapụ ya, a chọpụtara na enyi ya bụ Jubril, bụ onye ka na-eche ezinụlọ ya ka ha kwụọ ụgwọ, agbapụla.

Obinna kwuru na a kpụghachitere ya n’ụlọ ahụhụ ma nye ya iwu ka ọ kwụọ ụgwọ Jubril.

Mgbe ọ na-eti mkpu ka e mere ya ebere n’etiti iti ihe a na-eti ya oge niile na agụụ, ndị na-ejide ya na-abawanye ahụhụ ya ruo n’ọnwa mbụ nke Ọkụtoba mgbe o mesịrị gbanarị.

“Ebe m nọ n’ime ụlọ ihe karịrị ọnwa atọ n’ahụghị mbara igwe, apụghị m ịhụ ụzọ nke ọma mgbe m pụtara, amaghịkwa m ebe m ga-aga.

“Ka m nọ na-agagharị n’okporo ámá, ahụrụ m otu onye isi ojii gbakwuru ya. Akọọrọ m ahụhụ m nọ na ya wee rịọ ya maka enyemaka. Mgbe o nyechara m ekwentị ya ka m kpọtụrụ ndị ezinụlọ m nọ na Naịjirịa, ọ dụrụ m ọdụ ka m hapụ Saba maka na onyeisi m ga-abịa chọọ m,” Obinna chetara.

Nwoke ahụ nwere ezi obi,  ọ  dụrụ ya ọdụ ka ọ gaa Tripoli, nke e chere na e nweghi ntọrọ na ya.

Nwanne ya nwanyị, Uju, kwụrụ ọzọkwa ihe ruru puku naira iri ise nke onye Gambia jiri mee ka ọ dị mfe Obinna ime  njem banye Tripoli.

Ndoli na-aga n’ihu.

Iji zere onyeisi mbu ya ịchọta ya, onye ndu ya bụ onye Gambian  dụrụ ya ọdụ ka ọ gbanwee aha ya tupu ọ hapụ Saba, ọ were ngwa ngwa họrọ Jimmy South ka ọ bụrụ aha ọhụrụ ya.

O were ụbọchị isii iji gafee ọzara were banye Tripoli, ebe njem ahụ kwesịrị iwere naanị awa atọ.

A tụbara ya n’ebe a na-adọba ụgbọala ndị mmadụ juru, bụ́ ebe ọ malitere ịchọ ebe mgbaba o ga-ebi ruo mgbe ndị uwe ojii nwụchiri ya ma jide ya.

Ka abalị atọ gachara, mgbe ọ nweghị onye pụtara ịgbapụta ya, ndị uwe ojii tọhapụrụ ya n’okporo ụzọ, ebe ọ zutere Ejike, bụ onye Naijiria ibe ya kpọbatara ya n’ọrụ ịsa ụgbọ ala ya.

Ọ rụrụ ọrụ n’ebe a na-asa ụgbọ ala site n’Ọkụtoba ruo Disemba 2016 iji nweta ma chekwaa ego iji gaa Italy gafee Oké Osimiri Mediterenian, mana Ejike dụrụ ya ọdụ ka ọ chere ruo ọnwa March mgbe oke osimiri ahụ dajụrụ.

Obinna banyere n’ụgbọ mmiri Lampalampa (ụgbọ mmiri mpaghara ahụ) na  ọnwa March 2017 ịgafe oke osimiri Mediterenian mgbe ọ chọpụtara na ọtụtụ ndị enyi ya abanyelarị Italy megide ndụmọdụ Ejike na Jenụwarị 2017.

 

N’oge na-adịghị anya ụgbọ mmiri ahụ gabara, otu igwe ndị uwe ojii na-eche nche jidere ha wee chọpụta ọgwụ  ike n’aka otu n’ime ndị si mba ọzọ ahụ n’oge a na-eme nyocha .

E jidere ha ma ziga ha n’ụlọnga Tareq Ashooq dị na Saladin, Libya.

A kpọchiri ya n’akwụghị ụgwọ  ruo ọnwa ise  mgbe onye nche jụrụ ma anyị ga-arụrụ otu nwanyị Libya ọrụ, onye chọrọ onye na-elekọta ụlọ.

Ka ọnwa Ọgọstụ dị na mkpụrụ ụbọchị iri abuo na ano, n’ afọ 2017, a kpọbatara ya na otu nwanyị Libyan nke manyere ya,ya nay a were nwee mmekọ.

“M na-arahụ ụra n’ụlọ akwụkwọ “mama”  dị ka anyị na-akpọbu ya. Aha ụlọ akwụkwọ ahụ bụ Sahara al-Safin na Anzara Diplomacy.

“Ọtụtụ mgbe n’ime abalị, Mama  ga-eteta ka m bịa hichaa ụlọ. Mgbe ụfọdụ ọ ga-abụ ụlọ mposi, oge ọzọ ọ ga-abụ ịsacha rọgụ  ma ọ bụ uwe ọ na-eyi n’ime ahụ ya na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

O ruru mgbe ọ siri ọnwụ ka mụ na ya na-edina kwa ụbọchị. Echetara m ya na abụ m nwoke lụrụ di na nwunye na ebe m si bịa, ọ bụ  nsọala ka mụ na nwunye nwoke ọzọ hie ụra.

Ọ sịrị na ya ga-akpọghachi m n’ụlọ mkpọrọ, meekwa ka ndị uwe ojii tie m ihe n’emeghị ebere. Amanyere m ịkwa iko a ya ruo mgbe ike gwụrụ m wee malite ịkpa nkata ịgbapụ,” Obinna kwara n’arịrị.

Otu onye ya na ya na-arụkọ ọrụ n’ụlọ akwụkwọ ahụ nyere ya ekwentị, ma ọ kpọtụụrụ nwunye ya na Facebook nke mbụ ya kemgbe ndị na-azụ ahịa kewapụrụ ha.

O jikwa ohere ahụ kpọtụrụ ụfọdụ ndị enyi ya  na Tripoli bụ ndi nyere ya aka ịgbapụ n’ụlọ Mama.

Mgbe ha rutere Tripoli, ndị enyi Obinna dọrọ ya aka ná ntị na Mama nwere njikọ nke ọma ma nwee ike ịbịakwute ya, na-agba ya ume ka ọ gbaga Ịtali.

Ha nyere ya otu puku dinar ma jikọta ya na onye na-azụ ahịa iji nyere ya aka ịgbapụ Tripoli.

Ọ gara Zuwara, obodo dị n’ụsọ oké osimiri Libya awa abụọ site n’Ịtali gafee Oké Osimiri Mediterenian.

Na Nọvemba 17, 2017, Obinna banyere Lamalampa maka mbọ nke abụọ iji ruo Italy n’oké osimiri.

Mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ awa anọ n’oké osimiri, ụgbọ mmiri ahụ, nke a chọrọ iburu ndị njem di  iri  asatọ mana ndị o bu di otu nari na iri ise na isii(156 )bujuo ya, na-aga Tunis mgbe injin ụgbọmmiri  ahụ gbara ọkụ wee tụba ndị njem ya n’oké osimiri buu nnkwu ebiri mmiri .

“Ụgbọ mmiri ahụ, nke e wuru maka ndị njem 80 bu 156 wee gbaba n’etiti etiti oké osimiri. Ahụrụ m ọkụ n’ahụ m niile na ndị mmadụ na-amaba n’oké osimiri. Mmiri riri ọtụtụ mmadụ. Enweghị m ike ịkọwa otú m si ruo n’elu ala , “o chetara.

Ndị mmadụ 87 ndị gbanarịrị ihe mberede ụgbọ mmiri ahụ jere ije abalị anọ n’ime ọzara iji rute Tejulu iji gbanarị njide.

Ha nwere ihuoma izute onye Gambia nke kpọbatara ha n’ụlọ ọrụ ya wee nyere ha aka ịbanye ụgbọ ala na-aga Tripoli.

Agu ilachigha obodo ya.

Mgbe afọ abụọ nke ihe mgbu, agụụ, njide, na enweghị ike iru Italy, Obinna chetara ụlọ. Ọ malitere ịkwado ịlaghachi Nigeria.

Otú ọ dị, ndị enyi ya Tripoli kwuru na ọ dịghị ụgbọ elu si Libya na-aga Nigeria, ma e wezụga ụgbọ elu nke IOM (International Organisation on Migration).

Ọ gara ụlọ ọrụ ndị nnọchi anya Naịjirịa dị na Tripoli nke mbụ ya na Nọvemba 2017 wee tinye akwụkwọ maka ịlọta.

Mgbe o chere ruo February 2018 ma nataghị nzaghachi site n’aka ụlọ ọrụ nnọchiteanya, o chegharịa echiche, o kpebiri ịbanye Italy n’oké osimiri nke ugboro atọ.

Ntụgharị nke akara aka.

Obinna kwuru na ya echekwala ego ma dị njikere ịga Italy, mana ndị uwe ojii wakporo ogige ha dị na Zuwara, Libya, n’abalị ahụ ọ ga-apụ.

E jidere ya ma kpọga ya n’ụlọ mkpọrọ Osama nke Zawiya steeti Libya, bụ ebe a na-ata ọtụtụ mmadụ ahụhụ ma gbuo ha, na-egbutekwa akụkụ ahụ ha nye ndi n’atu mgbere akụkụ ahụ mmadụ kwa ụbọchị.

“Kwa ụbọchị, a ga-egbu mmadụ dị ka ehi nwere akụkụ ahụ ya dị ka akụrụ, imeju, obi, akụkụ ahụ nwoke kewapụrụ wee resị ndị ahịa akụkụ ahụ bụ́ ndị na-abịa mgbe niile,” ka o ji obi erughị ala cheta.

“N’otu oge, ndị mmadụ juru n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ọ dịkwa mkpa ka a na-ekpochapụ ya. E nwere m obi ụtọ iso ná ndị a bufere n’ụlọ mkpọrọ ọzọ dị na Zintan. E debere m ebe ahụ ọnwa abụọ. Ana m asụ Arabic nke ọma ugbu a, ka m nọrọ ihe karịrị ọnwa iri n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche.”

Obinna kwuru na site n’inweta ihuoma nke ya amaghi kay a ga-esi kọwaa, a họpụtara ya ka ọ bụrụ otu n’ime ndị na-enyere ndị na-elekọta ụlọ mkpọrọ aka ibugara ndị mkpọrọ ibe ya nri, uwe na ihe ndị ọzọ.

N’agbanyeghị ọkwa ọhụrụ ya, ọ naghị enwe afọ ojuju ma mesịa tinye akwụkwọ maka mbula ya na Mee 2018.

Ọ bụ otu onye n’ime ndị Naijiria di 160 ezigara ụlọ otu ọnwa ka e mesịrị, n’ime ihe karịrị mmadụ 300 nọ na ndepụta mbula.

Ụlọ n’ikpeazụ

N’abalị ise n’ọnwa Jun afọ 2018, Obinna ji ụgbọ elu ebula ndị IOM lọta na Naịjirịa.

Onye nwụrụ anwụ T B Joshua of Synagogue Church of All Nations nabatara ha mgbe ha rutere.

Ụka, dịka Obinna siri kwuo, gwara ha ka ha gwa ụwa, ọkachasị ndị nwere ike ịgabaga mba ọzọ, maka ihe egwu na nhụsianya dị n’ịga mba ofesi n’ụzọ iwu na-akwadoghị.

Dịka o siri kwuo,  TB Joshua n’oge ahụ nyere ha ego iji nyere ha aka ibido ndụ ọzọ.

“Akpọrọ m nwunye m ngwa ngwa na ọdụ ụgbọ elu Murtala Muhammed International Airport Lagos mgbe anyị rutere, anyị kwara ákwá na ekwentị na-echeta ihe niile anyị gabigara.

“Ọ gbara m ume ka m rịdata n’Abuja ma sonyere ya na ụmụaka n’ihi na ọ zụpụtara ego n’ọrụ ya.

“Akpọkwara m nne m ma rịọ mgbaghara. Nne m nwere obi ụtọ ịnụ olu m wee banye ụgbọ ala abalị site na ebe anyị bi na Suleja, “Niger State na Nigeria North-central region” iji zute m na Lagos ebe TB Joshua nyere anyị ebe obibi,” Obinna chetara.

Obinna zonari ezinaụlọ ya na ndị enyi ya wee nọrọ ọtụtụ oge ya n’ime ụlọ n’ihi ihere , ọkachasị ndị hụrụ ọbịbịa ya na Emmanuel TV.

E wezụga ọtụtụ ederede na ekwentị ndị na-akụda mmụọ, ọtụtụ ndị na-akwa ya emo dị ka ọdịda enweghị olileanya.

Taa, ya na ndị ọzọ na-akwaga mba ọzọ n’Abuja eguzobela otu na-ahụ maka mgbasa ozi akpọrọ “Migrants Lives Matter” ma na-eji ya dị ka ikpo oku na-akụziri ndị mmadụ gbasara njem na-adịghị mma na ịzụ ahịa mmadụ.

Ihe mere ndị mmadụ ji amalite njem na-adịghị mma

Ụlọ ọrụ National Agency for the Prohibition of Trafficking in Persons (NAPTIP) na Naijiria na-ekwu na njem na-adịghị mma maka enweghị agụmakwụkwọ na ịda ogbenye.

Na mkparịtaụka ya na onye nta akụkọ anyị gbara, onye isi ụlọ ọrụ NAPTIP na-ahụ maka mgbasa ozi ọha, Josiah Emereole, kwuru na anyaukwu, nrụgide ndị ọgbọ, na ijikọ ụwa ọnụ na-akpali ọtụtụ ndị na-eto eto ịga njem na-enweghị atụ.

“Mpụ na mpụ nke mpụ ndị a na-aga n’ihu bụ anyaukwu, nrụgide ndị ọgbọ, ijikọ ụwa ọnụ na ike nke ego mba ọzọ,” Maazị Emereole kwuru.

Ọ gwara ndị na-eto eto Naijiria ka ha ghara ịghọgbu ha na-aga mba ọ bụla na-ekwe nkwa ndụ ka mma ma ọ bụ ohere ọrụ na-ebughị ụzọ nyochaa ndị ọrụ gọọmentị dị mkpa.

Julie Okah-Donli, onye bụbu onye ntụzi NAPTIP na onye isi oche nke United Nations Voluntary Trust Fund for Victims of Trafficking in Persons (UNVTF), kwusiri ike na njem n’oge na-adịghị anya na ịzụ ahịa mmadụ ka enwere ike ijikọ aka ọnụ were kwụsị.

Ọ kpọkuru ndị otu obodo, ndị otu okpukperechi, na ndị na-abụghị ndị gọọmentị ka ha nyere gọọmentị aka igbochi njem  na-aga n’ihu oge niile  nke gbasara ịzụ ahịa mmadụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *