Ime njem n’ụzọ ekwesịghị ekwesi bụ ihe jọgburu onwe ya.Ọ na-egbutere ọtụtụ mmadụ ajọ aha,ntaramahụhụ na ihe ihere,makana onye ahụ mere njem di otu a na-emetọ aha ya na nke obodo ya.
Obodo ọ bụla nwere usoro onye mba ọzọ kwesiri iso tupu ọ bata na ya.
O nwere ọtụtụ ihe na-ebute ime njem n’ụzọ ezighi ezi.Ha bụ ihe ndi a:
1)Ihe isi ike :nke a bụ isi ahụrụ kwaba okpu na- ebute ụdị njem .
2)E nwetaghị akwụkwọ ikike eji eme njem n’ oge,sokwa n’isi sekpu nti n’ihe mere ụfọdụ ji eme njem na mba ofesi n’ụzọ ekwesịghị ekwesị.
3)Nghatọkọ usoro ọchịchị:Ọ bụrụ n’usoro ọchịchị adighi mma ,ụfọdụ ndi mmadụ ga-achọba ụzọ iji gbapụ n’obodo ha gaa mba ofesi,ka ha were gbanahụ ajọ ọchịchị.
4)Ọ bụrụ na ọnụ ego mba ọ bụla ada kpụọ afọ n’ala, karia otu o kwesiri,nke bụ na ọ gaghịzị azụlite ihe n’ahia etu o kwesiri,ndị ụfọdụ ga-achọba ụzọ isi gbapụ, gaa mba ofesi ọ bụla ebe ọnụ ego ha dị mma ma bakwaa uru.
5)Nghọgbu ụfọdụ ndị mmadụ na-aghọgbu mmadu ibe ha ka ha were ha wee tuo mgbere ire mmadu n’igba ohu.
AKỤKỌ IHE MERE EME NKE NA-EGOSIPUTA IHE DI OTU A.
Na igba ajụjụ ọnụ nke otu onye nta akụkọ bụ Amarachi Nwanguma n’ulọọrụ nta akụkọ VON(VOICE OF NIGERIA ) mere otu nwata nwoke aha ya bu Obinna Abu nke ụdị ihe a metụtara.
Obinna si Abu Agụ dị n’okpuru ọchịchị Nando nke Steeti Anambra, South-East Nigeria.
Obinna gụchara nzere na Classical Music na Nnamdi Azikiwe Federal University Awka, Steeti Anambra, n’afọ 2011.
Ka o mechara mmemme iji otu afọ fee ala nna ya bụ National Youth Service Corps (NYSC) na bekee n’afọ 2013, ọ gara n’okporo ámá dị n’Abuja na-achọ ọrụ mana ọ hụghị nke ọ bụla.
Ọ zutere ịhụnanya ya bu Azuka Perpetua. Ha lụrụ otu afọ ọ mechara NYSC ma mụọ ụmụ abụọ ka afọ abụọ gachara.
Obinna nwekwuru nkụda mmụọ nweta ọrụ ka o wee nwee ike ịkwado ezinụlọ ya obere.
Ọ bụ mgbe ahụ ka o kpebiri ịchọ enyemaka site n’aka Emeka, nwa nwanne nne nke bi na-arụ ọrụ na Italy.
Emeka mechara ghọrịa ya ma gwaa ya na ọ dịghị mkpa iji akwukwo ikike kwesiri were banye EUROPE.
O gara n’iru kowara ya na ha ga-amiba na EUROPE na-ejighi akwukwo ikike.Obinna were kwere.
Mgbe Obinna jiri mata na egwu esigo n’etili ogwu banye n’usurugada bu egwu ndi mmuo bu mgbe o malitere njem a ya na nwunye ya bu Azuka were rutee Lybia bu ebe erere ha ere.
Azuka bu onye noro ebe ahu ma nata ntaram ahuhu puru iche ebe ha na-agba ohu dika ndi erere ere.
Leave a Reply