Take a fresh look at your lifestyle.

Etu mmiri takpọrọ kamgbe iri ise siri lọghachite n’obodo Umudim

0 615

Ihe itụ n’anya mere n’obodo Umudim dina Steeti Imo dịka mmiri takpọrọ ma laa lọghachitere na nso nso a.

Ndị obodo ahụ kọwara na ya bụ mmiri na-abara uru dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-abịa ebe ahụ ekute ya e ji eme ihe dịịrị ha mkpa.

Otu nwaanyị obodo ahụ kwuru na mmiri ahụ nwere ikike inye onye ọbụla ihe ọma ọ chọrọ dịka ọganịhụ, ihu ọma na ihe ndị ọzọ.

Mmiri a dị ọcha nke bụ na ndị mmadụ nwereike ịṅụ ya ma were ya sie nri.

Nwoke gwara ndi ntaakuko okwu maka mmiri si na ha anaghị ahụ ya bụ ihe mere dịka ihe mmuọ agbanyeghị na ọ tụrụ ha n’anya.

O kwuru: “Anyị anaghị ekwe ka ndị mmadụ chụọ aja n’ihu mmiri a, anyị hapụrụ ya ka ọ nọrọ onwe ya dịka anyị chọrọ ịhụ etu o ga-esi dị n’ọdịnihu”

Nwoke ahụ kwụkwara na akụkọ mgbe gboo kwuru na ihe mere ya bụ mmiri jiri takpọọ ma laa bụ n’ihi ndị obodo ahụ agọtaghị ozi onye afaa zitere ha banyere ya bụ mmiri.

A gwara ha wete ọkụkụ ọcha nke nwoke nakwa nke nwaanyị mana ha ghọtaghere ya bụ ozi nke mere mmiri ahụ jiri takpọọ.

Onye ọkaibe n’ihe Sayensi nke ngalaba ‘Geology’ kọwaara ndi ntaakuko Igbo na ya bụ ihe mere n’obodo ahụ abụghị ihe omimi ndị mmụọ ka ọ bụ ihe na-mere onwe ya.

O kwuru na ọ bụ mgbanwe ihu eligwu na-akpata ihe dị etu a dịka ọ gara n’ihu kwuo na obodo ahụ abụghị ebe mbụ ihe dị etu a mere.

Kirie ihe onyonyo a n’uju ka ịhụ ihe ndị obodo ahụ kwuru.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *