Bola Ahmed Tinubu emeriela ntuliaka imeụlọ ndị otu ndọrọndọrọ All Progressive Congress bụ APC n’aha ịchafụ.
O ji vootu ọnụ ọgụgụ ya di otu puku nari abụọ iri asaa na otu (1271)were merie na ya bụ ntuliaka.
Onye nke abụọ Rotimi Amechi nwetara vootu ọnụ ọgụgụ ya di nari atọ na otu (301).
Dịka o siri dị ugbua, ọ bụ Bola Ahmed Tinubu ga-anọchite otu APC na ntuliaka onyeisiala Naijirịa nke a ga-eme n’afọ 2023.
Ndị so ya zọọ ya bụ ọkwa gụnyere osote onyeisiala Naijirịa bụ Yemi Osinbajo, onye bụbu Gọvanọ Imo Steeti bụ Rochas Okorocha, Tunde Bakare, Rotimi Amechi nakwa ndị ọzọ.
EBE FOTO SI,BOLA TINUBU/FACEBOOK
APC Primaries 2022: Ngụkọ na-egosi na Bola Tinubu ka enweta vootu ugbua na ntuliaka imeụlọ APC
Ngụkọ vootu na-aga n’ihu na ntuliaka ime ụlọ APC
Dịka ngụkọ ka na-aga n’ihu, onyeisi otu pati All Progressives Congress (APC) na Naịjirịa bụ Bola Tinubu ka enwete mkpọpụta aha na ndị tụnyere ya vootu.
Vootu Bola Tinubu na-arị elu ugbua ebe aha ndị ọzọ na-eso ya bụ aka chibụrụ Rivas steeti Rotimi Amaechi, na osote onyeisiala Naịjirịa bụ Yemi Osinbajo.
A na-agụ vootu ndị delegate mmadụ tụrụ 2260 dịka anya ọha na-ele ntuliaka APC bụ pati nọ n’ọchịchị Naịjrịa kemgbe 2015.
A malitere ngụkọ vootu a n’ebe elekere itoolu nke ụtụtụ Weneze, ụbọchị asatọ nke ọnwa Juun, 2022.
Ndị ‘delegate’ si Kaduna steeti bụ ndị ikpeazụ tụrụ vootu nke butere atụmvootu a na-eme na ntuliaka imeụlọ ndị pati APC n’isi njedebe
Lee ọnụ ọgụgụ so ngụkọ vootu ndị pụtara ịzọ ọkwa ugbua
- David Umahi – Vootu 38
- Tunde Bakare – Vootu 0
- Rotimi Amaechi – Vootu 301
- Yemi Osibanjo Vootu 235
- Rochas Okorocha – Vootu 0
- Yahaya Bello – Vootu 47
- Jack Rich – Vootu 0
- Ogbonnaya Onu – Vootu 1
- Ahmed Lawan – Vootu 152
- Ben Ayade – Vootu 37
- Ikeobasi Mokelu – Vootu 0
- Bola Ahmed Tinubu – Vootu 1271
N’ebe elekere iri. e mechara buru akpati e ji tụọ vootu gawa ebe a ga-anọ gụkọọ vootu.
Leave a Reply