Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisi ndi agha ala Naijirian amalitela amụma ọzụzụ

0 508

Onye Chief of Army Staff bụ, Lieutenant General Faruk Yahaya ekelela ụlọ ọrụ National Institute for Policy and Strategic Studies (NIPSS)n’aha ichafu maka ezi ọmụmụ ha nyere ndi agha n’ọtụtụ afọ gara aga.

General Yahaya kwupuitara nkea mgbe ọnabatara onye Direktọ General nke nke ụlọ ọrụ NIPSS bụ, Okanmuta Ayo Omotayo na ndi otu ya n’ogige  Army Headquarters dina Abuja.

Ọ kpokuru ndi ọrụ nchekwa ọzọ ka ha sonyere n’ọmụmụ ihe ndi National institute nwere inye ma kwa ndi isi ha ka ha rusia ọrụ ike iji nwe ezi nchekwa.

Onye Direcktọ General,ụlọ ọrụ National Institute for Policy and Strategic Studies, NIPSS bụ,Okanmuta Ayo Omotayo kwuru na ụlọ ọrụ ya nkwnye ugwu di ukwu nye ndi agha ala anyi ma kwuo etu ndi agha si akwado ụlọ ọrụ ya.

O gara n’ihu kwuo na “ndi agha ala Naijiria n’akwado ha nke ukwu nakwa ogbo ha ndi ọrụ nchekwa ọzọ.”

Ọkanmụta Omotayo kwuru; “Ala anyi na agabiga  ọtụtụ nsogbu nke mere ezi nchekwa jiri di oke mkpa.”

“Ndi agha ala Naijiria ndi n’agba mbo ichrekwa ala anyi mana akwado ulo oru anyi” Okanmuta Omotayo kowari nkea.

O toro ndi agha ala anyi maka irụrụ ha ụlọ obibi nakwa inwe ezigbo ndi isi.

Ụlọ ọrụ National Institute m’ọbụ NIPSS,ka eguzobere site usoro iwu Decree number20 nke afọ 1979, ugbua Cap N-51 Laws nke ala Naijiria, 2004.

Leave A Reply

Your email address will not be published.