Take a fresh look at your lifestyle.

Ụlọikpe Mkpegharị akụpụla mkpebi wepụrụ akụkụ 84(12) nke Iwu Ntuliaka afọ 2022

0 556

Ụlọikpe Mkpegharị akụchapụla mkpebi nke Ulọikpe Ukwu Etiti dị n’ụmụahịa nke kagburu akụkọ 84(12) nke Iwu Ntuliaka afọ 2022.

Akụkụ 84 (12) nke Iwu Ntuliaka 2022 kwuru sị, : “O nweghị onye a họrọ n’ọrụ nchọrọ ndọrọ ọchịchị nke ga-abụ onye ga-atụli vootu na ntuliaka imeụlọ nke pati ọbụla maka ịhọpụta onye ga-azọọ ọchịchị n’aha pati na ntuliaka.”

Na mkpebi ha, ndị ọkaikpe mmadụ atọ nyere mkpebi ahụ nke Jọstis Hamma Barka nọ n’isi ya kwuru na Ụlọikpe Ukwu Nke Etiti dị n’Ụmụahịa enweghị ikike ịge ikpe ahụ nke Nduka Edede gbara . Ụlọikpe Mkpegharị kwuru na Edede enweghị ikike ịgba ya bụ akwụkwọ.

Cheta na n’ọnwa Maachị afọ 2022, Nduka Edede bụ onye ọkaiwu mabụrụkwa onye ndọrọndọrọ ọchịchị otu ‘Action Alliance’ gbara akwụkwọ n’Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n’Ụmụahịa na-arịọ ka Ụlọikpe ahụ kagbuo Akụkụ 84(12) nke Iwu Ntuliaka 2022 maka imegide Akụkụ 66,107,137 na 182 nke Iwu Naijiria afọ 1999.

Ụlọikpe ahụ nke Justice Evelyn Anyadike nọ n’isi ya zara ekpere ya ma kpụpụ akụkụ 84(12) nke Iwu Ntuliaka afọ 2022 sị na o megidere iwu Naijiria.

Ọkaikpe Anyadike kwuru na onye ji ọrụ gọọmentị nọ n’ọkwa ọchịchị dịka iwu siri kwuo, nwere ohere itinye akwụkwọ arụkwaghịm abalị iri atọ tupu ụbọchị ntuliaka.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *