Take a fresh look at your lifestyle.
Ramadan

Ụmụ nwanyị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị: Nwunye onye isi ala Naijiria na-achọ nkwado ndị mba ọzọ.

0 22

Nwunye onye isi ala Naijiria, Oriakụ Aisha Buhari, akpọkuola ndị nnọchianya nke mba ndị nọchitere anya na Naijiria ka ha mee ọtụtụ ihe, iji hụ na ụmụ nwanyị na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Dị ka o si kwuo, nke a aghọwo ihe dị mkpa n’ihi mkpa ike ụmụ nwanyị na-enwe maka mmepe mba.

Nwunye onye isi ala rịọkwara ndị nnọchi anya mba ụwa ka ha nyekwuo nkwado nye ndị nwunye ndị isi Africa, ka ha nwee ike wuo àkwà mmiri na iweta udo karịa agha.

Oriakụ Buhari kpọrọ oku a na Abuja, isi obodo mba ahụ, mgbe ọ nabatara ndị isi ụmụ nwanyị nke ndị nnọchi anya mba ụwa, ụlọ ọrụ United Nations na ndị nwunye nke Ambassadors .

Ọ jara ha mma maka nkwado ha nyere ya n’oge gara aga dịka First Lady of Nigeria na President of African First Ladies Peace Mission (AFPLM) nakwa Foundation ya bụ The Future Assured.

Leave A Reply

Your email address will not be published.