Take a fresh look at your lifestyle.

Lee ihe anyị hụrụ na iwu Sit at Home n’mpaghara owuwanynwu

0 431

Ahia Main Market dị n’Onitsha n’ụtụtụ ụbọchị monde dika ebe agbara ọsọ agha.

Ndị ahịa apụtaghị maọlị belụsọ ndị mmadụ na-agara onwe na nke nke n’okporoụzọ.

Ọdọ ụgbọala ebe ndị ọkwọ ụgbọala na-eme njem aga-ebe dị iche iche n’ala Igbo mechichara emechi.

Okporoụzọ Upper Iweka na-ekwokarị ekwo dịka ebe ndị mmụọ chụsasiri ndị mmadụ ọsọ makana ị ga-agụtalị mmadụ olemole nọ ebe ahụ n’ụtụtụ taa.

Nke a na-abịa agbanyeghị nzukọ ndị isi ahịa na aka na-achị anambra steeti bụ Charles Soludo nwere n’izu ụka gara aga.

Na nzukọ ahụ, ha kwekọrịtara na ndị ahịa ga-emepe ahịa ụbọchị Mọnde ọbụla agbanyeghị na ndị mmadụ na-anọbụ n’ụlọ ụbọchị ahụ.

Ọtụtụ ọdọ ụgbọala tọgbọkwa chakoo agbanyeghị na ndị ọkwọ ụgbọala biara ya bụ nzụkọ gọvanọ Soludo na ndị ahịa mere.

N’Abakaliki dị n’Ebonyi steeti,

Ndị ọgbatum tum na-agagharị mana ahụghị ndị na-eme njem tere aka na-agba n’ụzọ taa.

N’Enugu,

Ọtụtụ okporoụzọ dị n’Enugu tọgbọọ chakoo dịka ndị mmadụ nọ n’ụlọ taa bụ Mọnde March 28, 2022.

N’Umuahia, okporoụzọ Akara – Uturu n’okpuru ọchịchị Ovim Isuikwuato dị n’Abia steeti.

Okporoụzọ Akara – Uturu n’okpuru ọchịchị Ovim Isuikwuato dị n’Abia steeti.

Okporoụzọ Osusu a na-esi aga Faults, ahia Ariaria nakwa ebe a na-esi amapụta okporoụzọ Port Harcourt na Enugu tọgbọọ chakoo.

N’Owerri dị n’Imo steeti,

Ụlọahịa ndị dị n’okporoụzọ Wethral dị n’Owerri mechichara emechi.

Ndị otu Ipob malitere ịnọ n’ụlọ ha kpọrọ ‘sit at home’ mgbe gọọmentị etiti Naịjiria nwụchiri Kanu bụ onyendu ha, n’afọ 2021.

Ha tinyere ya bụ ịnọ n’ụlọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjiria iji gosi nkwado ha maka ikpe Kanu.

N’afọ 2021, ha tinyere ya bụ ịnọ n’ụlọ kwa Mọnde ọbụla, mana ha mechara na-eme ya mgbe ọbụla Kanu kwesịrị ịpụta n’ụlọikpe.

Cheta na gọọmetị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu bụ onye ndụ otu Ipob na na mba Kenya n’afọ 2021 ebe ọ gbara ọsọ n’afọ 2017 mgbe ndị agha Naịjirịa wakporo ụlọ ya n’Afaraukwu Abia steeti.

Kamgbe e si mba Kenya kpọlata ya Naịjirịa, a na-ekpe ya ikpe maka ebubo iyi ndụ egwu nke gọọmentị Naịjirịa na-ebo ya.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *