Take a fresh look at your lifestyle.
Ramadan

A napụla Prince Andrew ikike ndị agha na ihe nrite ndị ọzọ

0 83

Isioche ọchịchị nke Buckingham nke Ezenwaanyị Elizabeth nọ n’isi ya ekwuola na ha ekpupula Prince Andrew okpu dịka nwa Eze ya na ikike na ihe nrita ọzọ so ọkwa ya dịka ikike na ihe nrita ọ nwere dịka onye agha Briten.

A na-akọwa na nke a ga-emetuta aha otutu ya ana etu ya dịka “His Royal Highness” n’ọgbọ ezumezu ndị ọha na Eze.

A ga-ekesa ọrụ ya nye ya ndị ọzọ na-arụ n’obi Eze.

Nke a na-abịa dịka a na-ekpe ya ikpe ịdinara otu nwaanyị mgbe ọ dị afọ iri na asaa (17) bụ nke ọ n-agọ na ya emeghị.

Ụbọchị Wenezde ka ụlọikpe n’Amerịka siri ọnwụ na ya ga-anụrịrị ya bụ ikpe Virginia Giuffre wetere agbanyeghị ihe niile ọkaiwu Prince Andrew mere ka aghara ikpe ya.

Ụlọọrụ oche Eze nwaanyị kwuru sị,” anyị ji ikike Ezenwaanyị nyere anyị ekwu na a napụla ikike na ihe nrite nke ndị agha nke Duke of York nwere na ewechiri ya Ezenwaanyi ozugbo ozugbo.

Ya bụ Nwa Eze agaghịzị enweikike anọchite anya Ezenwaanyị n’ọgbọ dịka ọ na-aza ajụjụ maka ebubo a n’aha ya”.

Ọnụ na-ekwur ndị agha Briten sị na ya agaghị etinye ọnụ na ya bụ okwu, na nke ahụ gbasara ndị obi Ezenwaanyị.

Nke a na-abịa dịka ndị agha mmadụ otu narị na iri ise tinyechere aka n’akwụkwọ maka ịrịọ Ezenwaanyị ka ọ napụ ya ikike ndị agha asatọ ọ nwere.

Nke a pụtara na Prince Andrew abụghịzị ihe ndị:

Honorary air commodore of RAF Lossiemouth

Colonel-in-chief of the Royal Irish Regiment

Colonel-in-chief of the Small Arms School Corps

Commodore-in-Chief of the Fleet Air Arm

Royal colonel of the Royal Highland Fusiliers

Deputy colonel-in-chief of The Royal Lancers (Queen Elizabeths’ Own)

Royal colonel of the Royal Regiment of Scotland.

Ụlọọrụ ọchịchị Ezenwanyị kwuburu na Andrew eweghịzị ikike ndị agha kemgbe ọ rituchara n’ọkwa na 2019.

Ọ kwa mba ofesi o ji gụnyere Colonel-in-chief of The Royal Highland Fusiliers Of Canada na Colonel-in-chief of the Royal New Zealand Army Logistic Regiment.

Leave A Reply

Your email address will not be published.