Ụlọ a dara n’ụbọchị iri na otu nke ọnwa Jenuwarị afọ 2022 n’ihe dịka elekere ise nke mgbede.
Aniagwu kwuru na mmadụ atọ nwụrụ ụnyiahụ ebe otu onye nwụrụ taa n’ụlọọgwụ.
O kwuru sị, “ọbụghị maka etu e siri rụọ ya bụ ụlọ mere ka akagbuo ya, ọ bụ nghọtaghe n’etiti ndị nwe ala na ndị rụrụ ụlọ ebe ahụ butere nkagbu a“.
Aniagwu kọwara na ọ ga-esiri gọọmentị ike ịnyocha ụlọ niile arụrụ were mara ma ha esiri ike.
O kwukwara na ha ehiwela atụmatụ ịnyicha ihere ka ya bụ ụlọ daa, ma sị na n’oge na adịghị anya na gọọmentị ga-ekwupụta mpụtara nyocha ha.
Onye ntaakụkọ anyị na-ekwu na ihe ruru mmadụ iri na asatọ merụrụ ahụ ebe a ka na-achọ ndị ọzọ achọ.
Ọ na-ekwu kwa na a na-aka ụka eji eme emume obubu ọnụ abalị iri abụọ na otu mgbe ụlọ a dara.
Ọ bụ kwa n’ebe ụmụaka na-aka ụka bu ụzọ daa.
Ndi nta akụkọ Igbo ghọtara na ndị ọrụ gbata gbata abịaghị n’oge, kama ha abịala n’ụtụtụ a ịzọpụta ndị ka tọrọ n’ime ụlọ ahụ.