Take a fresh look at your lifestyle.

Atụọla Mmadụ Iri Atọ Na Asatọ Mkpọrọ Maka Ngagharị Iwe

Amina Mohammed dere ya na bekee

0 347

Ka emechara ngagharị iwe ahụ kpara mkpamkpa na Lafia, isi obodo Nasarawa steeti n’ihi mkpebi ụlọikpe kacha elu kwadoro nhọpụta Gọvanọ Abdullahi Sule, mmadụ iri atọ na asatọ bụ ndị eborola ebubo ma kpọchie ha n’ụlọ mkpọrọ.

Ndị ngagharị iwe a, ndị eboro ebubo na ha na-akwado Peoples Democratic Party gbochiri akụkụ okporo ụzọ Lafia-Jos na ngagharị iwe na steeti Nasarawa.

Otú ọ dị, ndị ọrụ nchekwa nwụchiri ha, bụ́ ndị kpụpụrụ ha ozugbo ụlọikpe maka ọgbaghara megidere ọha.

E mechara kpọga ndị ngagharị iwe a na Nigeria Correctional Custodial Centre dị na Lafia na-eche akwụkwọ mgbapụta maka ụbọchị Mọnde abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Jenụwarị.

N’ime ndị ngagharị iwe a chụpụrụ bụ ndị nwoke ise na ụmụ nwanyị iri atọ na atọ.

Ụlọikpe Kasị Elu nwere na Fraịde na ikpe ya kwadoro Gọvanọ Abdullahi Sule dị ka onye meriri n’iwu na ntuli aka gọvanọ na steeti Nasarawa Maachị afọ 2023 nke butere ngagharị iwe na steeti ahụ.

 

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *