Take a fresh look at your lifestyle.

Onyeisiala Tinubu Akasiela Jonathan Obi Maka Ọnwụ Nwanne Ya Nwanyị

Temitope Mustapha dere ya na bekee

0 364

Onyeisiala Bola Ahmed Tinubu akasiwo onye bụbu Onyeisiala, Prezidenti Goodluck Jonathan maka ọnwụ nwanne ya nwanyị, Madam Obebhatein Jonathan.

N’ịbụ onye na-enwe ọmịiko na onye bụbu onye ndu, na nkwupụta nke ọnụ na-ekwuchitere ya, Ajuri Ngelale binyere aka, Onyeisiala Tinubu gbara ndị ezinụlọ Jonathan ume ka ha nweta nkasi obi na ihe nketa nke Madam Obebhetein bụ onye nyefere ndụ ya n’ijere Chineke na mmadụ ozi.

Onye isi ala na-ekpe ekpere maka izu ike nke mkpụrụ obi nke ndị nwụrụ anwụ na nkasi obi maka ndị niile na-eru uju ọnwụ na-egbu mgbu.

Madam Obebhatein, onye a na-akpọkarị Amissi, bụ onye nkuzi, nwanyị ọchụnta ego, nne nakwa nne nne.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *