Take a fresh look at your lifestyle.

A maala pastọ nwe ụlọụka ebe ndị otu ya ji agụụ kwụgbu onwe ikpe

0 476

Pastọ Paul Mackenzie na-agbasa ozioma na-ekwugide ịgba ọkwụ mgbochi, ụmụaka ịga akwụkwọ na nkuzi ndị ọzọ megidere teknụzụImage caption: Pastọ Paul Mackenzie na-agbasa ozioma na-ekwugide ịgba ọkwụ mgbochi, ụmụaka ịga akwụkwọ na nkuzi ndị ọzọ megidere teknụzụ

Ụlọikpe a maala ụkọchụkwụ nwe ụlọụka ihe ruru mmadụ nari ano ji agụụ kwụgbu onwe ha n’ihi olileanya ịga eluigwe mana ọ bụghị maka ebubo idufu ndị otu ya.

Ụlọikpe dị na Malindi ,na mba Kenya mara Paul Mackenzie ikpe maka inwe ụlọ mmepụta ihe onyonyo (film studio) o ji ezioziọma ma ekesa ihe onyonyo na- anataghị ikike.

Mana ọkaikpe kpere ya bụ ikpe amaghị ya ikpe n’ebubo na na ọ na-akpalite ka ụmụaka ghara ịga akwụkwọ.

E nwere ike ịtụ Mackenzie mkpọrọ afọ ise maọbụ adaa ya nha na ọnwa na-abịa bụ oge a ga-enye mkpebi okwu ya.

E kpebeghị Mackenzie ikpe maka narị kwuru narị ndị na-eso ya bụ ndị nwụrụ, na-agbanyeghị na e jichiri ya kemgbe ọnwa Eprelu.

A hụrụ ozu ọtụtụ ndị mmadụ e liri n’ini emighị emi dị n’ọhịa kpọtụrụ akpọtụ na mba kenya na mbido afọ.

E boro ebubo na Mckenzie na-edufu site idunye ha bụwa ọnụ iji rite alaeze eluigwe.

 

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *