Otu Labour Party n’Imo steeti eforola ntutu taa na ha ga-agbagha mmeri Hope Uzodimma nke APC n’ụlọikpe.
Onyeisioche otu ahụ n’Imo steeti bụ Callistus Iheagwa kwuru nke a mgbe ọ na-ezi ndị ntaakụkọ ozi dịka akpọpụtachara Hope Uzodimma dịka onye meriri ya bụ ntuliaka ọkwa Gọvanọ.
Iheagwa kwuru na atụmatụ ntuliaka ahụ juputere na mpụ na nrụrụaka.
O boro ndị ọrụ nchekwa ebubo na ha nyere ndị ọrụ Inec aka ihu na e mere wayo na ntuliaka ahụ iji mee ka Uzodimma merie.
Ha sị na mpụtara ntuliaka ahụ nke ezigbo ya gosiri na ọ bụ onye nke ha bụ Athan Achonu meriri ntuliaka ahụ.
Dịka ọ na gwa ndị ntaakụkọ okwu, Iheagwa sị na ntuliaka ahụ bụ “ohi e zuru n’ehihie nakwa mmetọ ọchịchị onyekwuoucheya”
Ọ sị na ntuliaka emeghi n’ụfọdụ obodo gụnyere Orsu, Orlu, Ideato North, Okigwe, Oguta nakwa Owerri Munincipal mana Inec gara n’ihu deere ha mpụtara ntuliaka
Ọ tara onye ọrụ Inec bụ Abayomi Fasina maka egeghị ntị n’okwu ndị a tupu ọ gaa ihu gụkọọ vootu ndị o ji ma kpọpụta Uzodimma dịka onye mmeri.
Ihejiagwa sị “ihe mere n’Imo steeti bụ adigboroja. Ọ bụ ihe ihere etu ndị ọrụ nchekwa si nye ndị ọrụ Inec na ndị otu APC ohere na nchekwa ịrụrụaka na ntuliaka ahụ”.
Hope Uzodimma onwe ya na-akpọ oku ka ndị o meriri bịa ka ha jikọọ aka bulie Imo steeti.
Leave a Reply