Take a fresh look at your lifestyle.

Ihe ikwesiri ima banyere Genevieve Nnaji

0 505

Genevieve Nnaji bụ nwaada Igbo a ma ama n’ime ejije nke aha ya na-akpọtụ na Naijiria na mba ndị ọzọ n’ihi nka ya.

O sonyela n’ihe nkiri karịrị iri asaa, ma nwetakwa ọtụtụ nturuugo na Naijiria nakwa n’Afrịka n’ihe gbasara ime ejije.

Ihe ada Mbaise a na-eme na-atụ ndị mmadụ n’anya nke na ọtụtụ na-ahụ ya dịka ụgbala enweghị oyiri.

Mana agbara a abụghị kwanụ mmụọ; lee ihe ụfọdụ o merela mere e ji ahụ ya ka ‘nwa mama’:

1. Na nso nso a o wepụtara ihe onyonyo n’akara Igwe okwu na-ewu ugbua a kpọrọ Tiktok nke mere aha ya ji malite iwu na Twitter.

Ụfọdụ na-efezi ya ka chi kpọrọ ya “Beyonce nke Afrika”.

Ebe ụfọdụ ji ụmụnwaanyị kara aka dịka Agbani Darego, Omotola Jalade Ekeinde, Nse Ikpe Etim atụnyere ya.

Mana ndị ọzọ si na o nwere ihe dị iche n’etiti akara edemede ‘B’ na ụkwụ ehi.

2. Ọ haziri ejije ‘Lion Heart’ nke kpọtụrụ akpọtụ na mba uwa niile.

E mechara họrọ ya bụ ejije ka ọ nọchite anya ejije ndị Naịjirịa na emume nturuugo ‘Oscar’ nke afọ 2019, mana ọ garughi n’isi mmiri.

Ya bụ ihe mere ka iwe too ọtụtụ ụmụ Naijiria afọ dịka ha kwuru na nzere ahụ tọsịrị Genevieve na ihe nkiri ‘Lion Heart.’

3. Genevieve gbara n’ihe onyonyo ọkpọka nwaanyị mba Amerịka a kpọrọ Oprah Winfrey n’afọ 2009, oge enwebeghị onye ihe nkiri Naijiria rọwara ụdịrị nrọ ahụ.

Oprah kwuru na Genevieve bụ “Julia Roberts nke Afrịka.”

4. A na-ahụ ndị isi ojii bu ntutu ha dịka chi si kee ya dịka ndị Mgbeke.

Mana n’afọ ole na ole gara aga, nwaada Genevieve laghachịrị n’isi ya etu chi ndị isi ojii siri kee ya.

Nzọụkwụ a mere ka ọtụtụ jaa ya mma maka ịkwado ihe ndị isi ojii.

5. Genevieve abụghị naanị n’ime ejije ka o nwere aha, aha ya dịkwa n’aha ndị e ji ihu ha ere ahịa dịka ọ kpọtụrụ akpọtụ mgbe o mere ‘face of Lux.’

Na nso nso a, akpụnwa a tiri akwa e ji egwu mmiri maọbụ nọrọ ezumike n’ikperemmiri see foto gosiri ya dịka ‘tomato Jos’ n’agbanyeghị na o teela Awụsa na ụta.

6. Nwaada ịtụ ime mkpuke abụghị ihe ọhụrụ.

Mana ihe Genevieve jiri dị iche na ndị nọrọla be nna ha mụọ nwa bụ na ọ chịkọtara onwe ya chụwa akara aka ya na-eleghị anya n’azụ.

Nke a mere na ọtụtụ anaghị echetazi na o nwere mgbe ‘leather’ bụ kanda nkịtị.

Ndụ nwata a nke nne ya bụbu onye nkuzi ọtakara na-akasi ọtụtụ enweghị olileanya obi, n’ihi na ọ bụ onye nwere etu o si ebu onwe ya nke mere ka a na-ahụ ya dịka onye ngala kwesịrị.

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *